Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Sean Gladwell/Moment via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Ndị Ọchịchị n’Ụwa Niile Emefuola Ihe Karịrị Puku Ijeri Dọla Abụọ Maka Ndị Agha Ha​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ndị Ọchịchị n’Ụwa Niile Emefuola Ihe Karịrị Puku Ijeri Dọla Abụọ Maka Ndị Agha Ha​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’afọ 2022, ndị ọchịchị n’ụwa niile mefuru puku ijeri dọla abụọ, narị ijeri abụọ na ijeri iri anọ (2.24 trillion dollars) maka ndị agha ha. Nke a bụ nke mbụ ha na-emefu ego ruru otú ahụ n’ihe gbasara ndị agha. Ihe mekwara ha ji mefuo ego a bụ maka agha ndị Rọshịa na-alụso ndị Yukren. N’akụkọ ụlọ ọrụ Stockholm International Peace Research Institute (SIPRI) dere n’ọnwa Eprel afọ 2023, ha kwuru gbasara afọ 2022, sị:

  •   Ego ndị agha ndị Yurop mefuru n’afọ ahụ “ji okpukpu iri na atọ rịa elu. Nke a bụ nke mbụ ndị Yurop na-emefu ego ruru otú a n’otu afọ kemgbe a lụchara agha n’afọ 1991.”

  •   ‘Ego ndị Rọshịa mefuru ji ihe karịrị okpukpu itoolu karịa nke ha na-emefubu. O meziri ka ha bụrụ mba nke atọ kacha mefuo ego n’ụwa niile.’

  •   N’ụwa niile, ọ ka bụ Amerịka kacha emefu ego n’isi ndị agha. Ihe mere e ji kwuo ya bụ na e kee ego niile e mefuru n’isi ndị agha n’ụwa niile ụzọ atọ, ọ bụ mba Amerịka mefuru otu ụzọ n’ime ya.”

 Dr. Nan Tian, onye so ede akụkọ n’ụlọ SIPRI kwuru, sị: “Otú ndị ọchịchị n’ụwa niile si emefukwu ego n’ihe gbasara agha n’afọ ndị a, na-egosi na nsogbu na-akakwu nkụ n’ụwa a anyị bi na ya.”

 Baịbụl buru amụma na ndị ọchịchị siri ezigbo ike ga na-alụsokwu ibe ha agha ma na-akpatakwuru ibe ha ọgba aghara. Baịbụl gwakwara anyị ihe ọ bụ naanị ya ga-eme ka udo dị.

E buru amụma na a ga na-alụkwu agha

  •   Baịbụl kwuru na oge a anyị bi bụ ‘oge ikpeazụ.’​—Daniel 8:19.

  •   Akwụkwọ Daniel buru amụma na n’oge ikpeazụ, ndị na-achị ụwa ga na-ama ibe ha aka. Ndị ọchịchị a “ga-enurịta ibe ha aka,” ya bụ, ha ga na-alụso ibe ha ọgụ ka wee buru ọkaibe. Ka ha na-alụ ọgụ a, ha ga na-emefukwa “akụ̀” ha, ya bụ, ego ha.​—Daniel 11:40, 42, 43.

 Ị chọọ ịmatakwu banyere amụma Baịbụl a na-emetụ n’ahụ́, lee vidio bụ́ Otú Amụma E Buru na Daniel Isi 11 Si Mezuo.

Ihe ga-eme ka udo dị

  •   Baịbụl kwuru na Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ. Ọ “ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Alaeze ahụ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma naanị ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”​—Daniel 2:44.

  •   N’oge na-adịghị anya Jehova a Chineke ga-eme ihe ụmụ mmadụ na-agaghị emeli, ya bụ, ime ka udo dịrị n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ ga-eji Alaeze ya nke dị n’eluigwe bibie ngwá agha niile ma mee ka tigbuo zọgbuo kwụsị.​—Abụ Ọma 46:8, 9.

 Gụọ isiokwu bụ́ “Udo Ga-adị Ebe Niile’ n’Alaeze Chineke,” ka ị matakwuo banyere ihe Alaeze Chineke ga-eme.

a Jehova bụ aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.