ỊKPỌ NDỊ MMADỤ KA HA BỊA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS
Jizọs Ga-akwụsị Mpụ
Jizọs ma otú ọ na-adị anyị ma anyị na-ata ahụhụ n’ihi mpụ na ikpe na-ezighị ezi. A ghagidere ya ụgha, kụọ ya ihe n’enweghị ihe o mere, kpee ya ikpe mkpegbu, maa ya ikpe arụrụala, jirikwa obi ịta mmiri kwụgbuo ya. N’agbanyeghị na aka ya dị ọcha, ọ chọrọ ọdịmma ndị ọzọ, sikwa n’ala ala obi ya “nye ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28; Jọn 15:13) Ugbu a, ọ bụ Eze nke Alaeze Chineke. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-akwụsị mpụ ruo mgbe ebighị ebi, hụkwa na a na-ekpe ikpe ziri ezi n’ebe niile n’ụwa.—Aịzaya 42:3.
Baịbụl kwuru otú ụwa ga-adị mgbe Jizọs ga-akpa ike a. Ọ sịrị:
“N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ. Ị ga-ele anya n’ebe ha na-anọ, ma ha agaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, obi ga-adịkwa ha ezigbo ụtọ maka na ha ga-anọ nnọọ n’udo.”—Abụ Ọma 37:10, 11.
Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jizọs meere anyị nakwa ihe ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu? Na Luk 22:19, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta ọnwụ ya. Ọ bụ ihe ahụ o kwuru mere Ndịàmà Jehova ji ezukọta kwa afọ iji cheta ọnwụ Jizọs. Anyị na-akpọ gị ka i soro anyị cheta ọnwụ Jizọs na Sọnde, Mach 24, 2024.