Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NA-ECHENỤ NCHE!

Mgbagbu A Na-agbagbu Ndị Mmadụ n’Ụlọ Akwụkwọ​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Mgbagbu A Na-agbagbu Ndị Mmadụ n’Ụlọ Akwụkwọ​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’abalị 24 n’ọnwa Mee, 2022, ihe jọgburu onwe ya mere n’obere obodo a na-akpọ Yuvalde nke dị na Teksas, Amerịka. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru na otu nwoke ji égbè bata n’ụlọ akwụkwọ a na-akpọ Robb Elementary School gbagbuo ụmụ akwụkwọ iri na itoolu na ndị nkụzi abụọ.

 Ọ dị mwute na ụdị ihe ọjọọ a na-emekarịzi n’oge a. Akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today kwuru na n’ime afọ gara aga, a gbagburu ndị mmadụ n’ụlọ akwụkwọ ugboro narị abụọ na iri anọ na itoolu naanị n’Amerịka. E nwetụbeghị mgbe e gburu ndị mmadụ otú a n’ụlọ akwụkwọ kemgbe afọ 1970.

 Gịnị mere ihe ọjọọ niile a ji eme? Olee otú anyị ga-esi na-edi ụdị ihe ọjọọ a? E nwere ihe mere anyị ga-eji na-atụ anya na ụdị tigbuo zọgbuo a ga-akwụsị? Baịbụl zara ajụjụ ndị a.

Gịnị mere tigbuo zọgbuo ji ju ebe niile n’ụwa?

  •   Baịbụl kwuru na oge a bụ “oge ikpeazụ,” oge ọtụtụ ndị na-agaghị enwe “obi mmadụ,” bụrụkwa “ndị tigbuo zọgbuo.” Ha ga na-eme ihe ọjọọ dị iche iche. Ndị na-akpa ụdị àgwà ọjọọ ndị a “ga na-akakwu njọ.” (2 Timoti 3:1-5, 13) Ị chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru gbasara oge ikpeazụ, gụọ isiokwu bụ́ “Did the Bible Predict the Way People Think and Act Today?

 Ọtụtụ ndị na-ajụ, sị, ‘Gịnị mere na Chineke anaghị akwụsị ihe ọjọọ ndị na-emenụ dị ka ịgbagbu ndị mmadụ n’ụlọ akwụkwọ?’ Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Ihe Ọjọọ Ji Eme Ndị Ezigbo Mmadụ?” ka ị mata ihe Baịbụl kwuru.

Olee otú anyị ga-esi na-edi ụdị ihe ọjọọ a?

  •   “E dere ihe niile e dere n’oge gara aga ka e jiri ha kụziere anyị ihe, ka . . . nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ wee mee ka anyị nwee olileanya.”​—Ndị Rom 15:4.

 Ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere anyị aka ịna-edi tigbuo zọgbuo juru n’ụwa a. Gụọ Teta! bekee isiokwu ya bụ́ “Will Violence Ever End?” ka ị matakwuo ihe Baịbụl kwuru.

 Ndị nne na nna nwere ike ịgụ isiokwu bụ́ “Disturbing News Reports and Your Children” ka ha hụ ihe ndị e kwuru ha nwere ike ime iji nyere ụmụ ha aka ịma ihe ha ga-eme ma ha hụ ma ọ bụ nụ akụkọ na-atụ egwu na tiivi ma ọ bụ gụta ya n’akwụkwọ akụkọ.

Ụdị tigbuo zọgbuo a ọ̀ ga-akwụsị?

  •   “Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike.”​—Abụ Ọma 72:14.

  •   “Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi. Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha. Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.”​—Maịka 4:3.

 Chineke ga-eme ihe ụmụ mmadụ na-enweghị ike ime. Alaeze ya dị n’eluigwe ga-eme ka ngwá agha ọ bụla ghara ịdị, kwụsịkwa tigbuo zọgbuo niile. Gụọ isiokwu bụ́ “‘Udo Ga-adị Ebe Niile’ n’Alaeze Chineke” ka ị matakwuo ihe Alaeze Chineke ga-eme.