Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NA-ECHENỤ NCHE!

Mgbagbu A Na-agbagbu Ndị Mmadụ n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Mgbagbu A Na-agbagbu Ndị Mmadụ n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’ọnwa Julaị 2022, ndị tigbuo zọgbuo ji égbè gbagbuo ndị mmadụ n’ebe dị iche iche n’ụwa:

  •   N’abalị iri n’ọnwa Julaị 2022, otu akwụkwọ akụkọ aha ya bụ The Japan Times dere, sị: “Ogbugbu e gburu Shinzo Abe, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama na Japan, onye bụbukwa Praịm Minista Japan, mere ka obi ghara iru ndị obodo a ala ma mee ka ụjọ na-atụ ndị nọ ebe dị iche iche n’ụwa. Ihe mere o ji dị otú a bụ na e jighị tigbuo zọgbuo mara ndị Japan. Ọ bụkwa mmadụ ole na ole na-eji égbè n’obodo a n’ihi ihe iwu kwuru.”

  •   Otu akụkọ e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ aha ya bụ Reuters n’abalị anọ n’ọnwa Julaị 2022 kwuru na ezigbo ụjọ ji ndị Denmak maka na e nwere ndị ji égbè gaa gbagbuo mmadụ atọ n’otu ụlọ ahịa dị na Kọpenhagen.

  •    Otu akụkọ e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ aha ya bụ The Guardian n’abalị iri n’ọnwa Julaị 2022, kwuru na e nwere ndị ji égbè banye n’ebe ndị mmadụ na-aṅụ mmanya na Soweto dị na Saut Afrịka gbagbuo mmadụ iri na ise.

  •   N’abalị ise n’ọnwa Julaị 2022, otu ụlọ ọrụ nta akụkọ aha ya bụ CBS News kwuru na ndị omekome ji égbè gbagbuo ihe karịrị narị mmadụ abụọ na iri abụọ (220) n’Amerịka ná ngwụcha izu abalị anọ n’ọnwa Julaị. Oge ahụ bụ oge ndị Amerịka nọ na-eme ememme ha ji echeta mgbe ha nweere onwe ha n’aka ndị chịrị ha.

 È nwere olileanya na ụdị tigbo zọgbuo a ga-akwụsị? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Tigbuo Zọgbuo Ga-akwụsị

 Baịbụl kwuru na oge anyị a bụ “oge ikpeazụ.” Ọ bụ oge ndị tigbuo zọgbuo ga na-akpa arụ ma na-eme ihe ndị na-egosi na ha enweghị obi mmadụ. (2 Timoti 3:​1, 3) Ụdị ihe ndị a na-eme ka ndị mmadụ chịrị obi n’aka. (Luk 21:11) Ma, Baịbụl kwere anyị nkwa na oge na-abịa mgbe tigbuo zọgbuo na-agaghịzi adị. Mgbe ahụ ‘udo ga-adị ebe ndị mmadụ ga-ebi. Obi ga-erukwa ha ala ebe ahụ. Ebe ha ga na-ezu ike ga-adakwa jii.’ (Aịzaya 32:18) Olee otú tigbuo zọgbuo ga-esi kwụsị?

 Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume, bibiekwa ngwá agha niile.

  •   “A ga-ekpochapụ ndị ajọ omume n’ụwa.”​—Ilu 2:22.

  •   “[Chineke] na-eme ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-agbajisịkwa ube. Ọ na-agba ụgbọ e ji alụ agha ọkụ.”​—Abụ Ọma 46:9.

 Chineke ga-akwụsị ihe ndị na-akpata tigbuo zọgbuo. Otú ọ ga-esị akwụsị ha bụ ịkụziri ndị mmadụ otú ha na ibe ha ga-esi na-adị n’udo.

  •   “Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́, ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu m niile dị nsọ, n’ihi na amamihe gbasara Jehova ga-ejupụta ụwa otú mmiri si ejupụta oké osimiri.”​—Aịzaya 11:9.

  •   Ma ugbu a, Chineke na-akụziri ndị bi n’ụwa niile otú ha ga-esi kwụsị ịbụ ndị tigbuo zọgbuo ma ghara ịna-egbu ndị mmadụ mma ma ọ bụkwanụ na-agba ha égbè. Ọ na-akụziri ha ka ha kpụgharịa “mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi.”​—Maịka 4:3.

 Ị chọọ ịmatakwu gbasara nkwa ahụ Baịbụl kwere na ihe ndị na-eme ka ụjọ na-atụ ndị mmadụ agaghịzi adị n’ụwa, gụọ isiokwu bụ́ “Nnwere Onwe Pụọ n’Ụjọ Ò Kwere Omume?

 Ị chọọ imatakwu otú a ga-esi mee ka tigbuo zọgbuo kwụsị kpam kpam, gụọ isiokwu bụ́ “Peace on Earth at Last!