Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NA-ECHENỤ NCHE!

Ndịàmà Jehova na Mgbukpọ E Gbukpọrọ Ndị Mmadụ—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ndịàmà Jehova na Mgbukpọ E Gbukpọrọ Ndị Mmadụ—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’abalị 27 n’ọnwa Jenụwarị afọ 2023, ọtụtụ ndị ga-eme ememme iji cheta ndị e gburu n’oge ndị Nazi na-achị. Ọ karịala afọ iri asaa na ise ihe a jọgburu onwe ya mere. O nwekwara ike ịbụ na ị na-eche ihe mere Chineke ji kwe ka e gbukpọọ ndị mmadụ otú ahụ.

 E mesiri ndị Juu ezigbo ike mgbe ahụ e gbukpọrọ ndị mmadụ n’oge ndị Nazi na-achị. A kpachaara anya gbuo nde kwuru nde n’ime ha. A kpagbukwara ọtụtụ ndị ọzọ na-abụghị ndị Juu, gbuokwa ha n’oge ahụ. Ndịàmà Jehova so ná ndị ahụ. A kpagburu ha maka ihe ha kweere.

Ọdịnihu dị mma na olileanya

 Ọtụtụ ndị na-atụ ụjọ na e nwere ike igbukpọ ndị mmadụ ọzọ otú ahụ e mere n’oge gara aga. Ma, obi dị anyị ụtọ na Baịbụl kwere nkwa na oge na-abịa mgbe ụdị ihe ahụ na-agaghịzi na-eme.

  •   “Jehova kwuru, sị, ‘Ama m nnọọ ihe m na-echere unu. Ọ bụ ka udo dịrị unu, ọ bụghị ka ọdachi dakwasị unu. M chọrọ ka ihe dịrị unu ná mma n’ọdịnihu nakwa ka unu nwee olileanya.’”​—Jeremaya 29:11. a

 Ihe a Baịbụl kwuru ga-emezu mgbe Jehova Chineke ga-eme ka ihe ọjọọ kwụsị, doziekwa ihe niile ihe ọjọọ ndị ahụ a na-eme mebiri. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ihe ndị a:

  •   Ọ ga-ebibi ndị ọjọọ, ndị na-emesi ndị ọzọ ike.​—Ilu 2:22.

  •   Ọ ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ịta ahụhụ.​—Mkpughe 21:4.

  •   Ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ka ha dịrị ndụ n’ụwa.​—Jọn 5:​28, 29.

 Obi kwesịrị isi gị ike na ihe ndị a Baịbụl kwuru, ndị na-akasi anyị obi, ga-emezu. Ị chọọ ịmata ihe mere obi ga-eji sie gị ike, anyị na-agba gị ume ka ị mụọ Baịbụl. I nwere ike ikwu ka anyị na gị mụwa ya.

a Jehova bụ aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.