Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Yan Zabolotnyi/stock.adobe.com

NA-ECHENỤ NCHE!

Otú Mmebi Iwu Si Ju Ebe Niile n’Ụwa​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Otú Mmebi Iwu Si Ju Ebe Niile n’Ụwa​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Òtù dị iche iche na-akpata tigbuo zọgbuo ọtụtụ ebe na Heiti. Na Saụt Afrịka, Meziko, na ụfọdụ mba ndị dị na Kọntịnent Saụt Amerịka, ndị mmadụ na-atagbu onwe ha n’ahụhụ n’ihi mpụ na tigbuo zọgbuo. N’ebe ndị a na-anaghịzi enwe tigbuo zọgbuo, obi ka na-ekokwa ndị mmadụ n’elu n’ihi otú ndị mmadụ si ezu ohi, na-emebisi ihe ndị ọzọ, na-agbakwa ngwongwo ndị mmadụ ọkụ.

 Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara otú mmebi iwu si ju ebe niile n’ụwa?

Ihe Baịbụl kwuru gbasara mmebi iwu

 Baịbụl kwuru na mmebi iwu so n’ihe ndị ga na-eme ‘n’ọgwụgwụ oge a.’ (Matiu 24:3) Mgbe Jizọs nọ na-ekwu gbasara ihe ndị ọzọ ga na-eme n’oge ọgwụgwụ, ọ sịrị:

  •   “Ịhụnanya ọtụtụ ndị ga-ajụkwa oyi n’ihi otú mmebi iwu si ju ebe niile.”​—Matiu 24:12.

 Baịbụl kwukwara na ‘n’oge ikpeazụ,’ ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-anaghị ejideli onwe ha, ndị tigbuo zọgbuo, ndị ihe ọma na-anaghị amasị.” (2 Timoti 3:1-5) Ụdị àgwà ndị a, bụ́ ndị na-egosi na ndị mmadụ na-achọ naanị ọdịmma onwe ha, so n’ihe mere mmebi iwu ji ju ebe niile taa.

 Ma, e nwere ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Baịbụl kwere anyị nkwa na n’oge na-adịghị anya, mmebi iwu ga-abụzi ihe akụkọ.

  •   “N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ. Ị ga-ele anya n’ebe ha na-anọ, ma ha agaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, obi ga-adịkwa ha ezigbo ụtọ maka na ha ga-anọ nnọọ n’udo.”​—Abụ Ọma 37:10, 11.

 Chọpụtakwuo ihe ndị Baịbụl kwuru na-eme ka anyị nwee olileanya na ihe mere obi kwesịrị iji sie gị ike na ihe ndị na-eme n’ụwa taa na-emezu amụma Baịbụl. Gụọ isiokwu ndị a.

 Olileanya E Ji n’Aka na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu

 Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ?

 Baịbụl Ò Kwuru na Ndị Mmadụ Ga Na-eche Echiche Otú Ha Si Eche Taa ma Na-akpa Àgwà Otú Ha Si Akpa?