Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NA-ECHENỤ NCHE!

Oké Okpomọkụ A Na-enwe n’Ụwa Niile​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Oké Okpomọkụ A Na-enwe n’Ụwa Niile​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’ọnwa Jụlaị afọ 2022, e kwuru na e nwere oké okpomọkụ n’ụwa niile:

  •   N’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Julaị afọ 2022, ụlọ ọrụ nta akụkọ aha ya bụ CNN kwuru na ndị ọchịchị Chaịna gwara ndị ala ha ugboro abụọ n’ọnwa a na a ga-enwe oké okpomọkụ n’ihe dị ka obodo iri asaa dị n’ala ahụ.

  •   Otu akụkọ e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ aha ya bụ The Guardian n’abalị iri na asaa n’ọnwa Julaị afọ 2022 kwuru na ọkụ na-agbapịa oké ọhịa ndị dị na Yurop n’ihi oké okpomọkụ e nwere ebe ahụ.

  •   Otu akụkọ e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ aha ya bụ The New York Times n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Julaị afọ 2022 kwuru, sị: “N’ụbọchị Sọnde, obodo dị iche iche dị n’Amerịka bịara kpowe ọkụ karịa otú ha na-ekpobu n’ihi oké okpomọkụ e nwere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Amerịka, n’Ebe Ndịda Amerịka nakwa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Amerịka.”

 Gịnị ka ihe a niile pụtara? Ụwa ọ̀ ga-emecha bụrụ ebe na-agaghị ekwe obibi? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

È buru amụma na a ga-enwe oké okpomọkụ n’ụwa?

 Ee. Oké okpomọkụ a na-enwe n’ụwa ugbu a dabara n’ihe Baịbụl kwuru ga na-eme n’oge anyị a. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru na anyị ga-ahụ “ihe ndị na-atụ egwu.” (Luk 21:11) Oké okpomọkụ zuru ụwa ọnụ na-eme ka ọtụtụ ndị na-atụ egwu na ndị mmadụ ga-ebibi ụwa a.

Ndị mmadụ hà ga-ebibi uwa a nke na ọ gaghị ekwe obibi?

 Mba. Chineke kere ụwa a ka ndị mmadụ biri na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 115:16; Ekliziastis 1:4) Kama ikwe ka ndị mmadụ bibie ụwa, Chineke kwere nkwa na ya ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’​—Mkpughe 11:18.

 Lee amụma abụọ n’ime amụma ndị na-egosi nkwa Chineke kwere gbasara ụwa a:

  •   “Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị. Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.” (Aịzaya 35:1) Chineke agaghị ahapụ ụwa a ka ọ ghọọ ala ịkpa nke na o nweghị onye ga-ebili na ya. Kama ịhapụ ya, ọ ga-emezi ebe ọ bụla ndị mmadụ bibiri.

  •   “Ị na-elekọta ụwa, na-eme ka ọ na-eme ezigbo nri n’ụba.” (Abụ Ọma 65:9) Chineke ga-agọzi ụwa, ya abụrụ paradaịs.

 Ị chọọ ịmatakwu gbasara otú oké okpomọkụ ma ọ bụ oké mmiri ozuzo si na-emezu amụma Baịbụl, gụọ isiokwu bụ́ “Climate Change and Our Future​—What the Bible Says.”

 Ị chọọ ịmatakwu gbasara nkwa Baịbụl kwere anyị banyere imezi ụwa a, gụọ isiokwu bụ́ “Who Will Save the Earth?