Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

sinceLF/E+ via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Ònye Ga-azọpụta Ndị Nkịtị?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ònye Ga-azọpụta Ndị Nkịtị?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Akụkọ ndị a si n’ụlọ ọrụ Òtù Mba Ụwa:

  •   Malite n’abalị 7 ruo abalị 23 n’ọnwa Ọktoba afọ 2023, agha ndị Gaza na ndị Izrel na-alụ ataala isi ihe karịrị puku mmadụ isii na narị mmadụ anọ (6,400), ihe karịrị puku mmadụ iri na ise na narị mmadụ abụọ (15,200) emerụọkwala ahụ́. Ọtụtụ n’ime ndị a abụghị ndị agha. Ọtụtụ narị puku mmadụ agbaakwala ọsọ ndụ n’ihi agha ahụ.

  •   Ka ọ na-erula abalị 24 n’ọnwa Septemba afọ 2023, agha Rọshịa na Yukren na-alụ egbuola puku ndị nkịtị itoolu na narị asaa na otu (9,701), merụọkwa puku iri na asaa na narị mmadụ asaa na iri anọ na asatọ (17,748) ahụ́ na Yukren.

 Gịnị ka Baịbụl kwuru ga-eme ka ndị na-ata ahụhụ n’ihi agha nwee olileanya?

Ihe mere ha ga-eji nwee olileanya

 Baịbụl kwuru na Chineke ga-eme “ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.” (Abụ Ọma 46:9) Ọ ga-eji alaeze ma ọ bụ ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị dochie ọchịchị ụmụ mmadụ niile. (Daniel 2:44) Alaeze Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha.

 Legodị ihe Jizọs Kraịst, bụ́ Eze Alaeze Chineke, ga-eme:

  •   “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka, napụtakwa onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere, ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye. Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike.”​—Abụ Ọma 72:12-14.

 Chineke ga-eji alaeze ya mee ka nhụsianya na ahụhụ agha na tigbuo zọgbuo kpatara kwụsị kpamkpam.

  •   “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị. Ihe mbụ niile agafeela.”​—Mkpughe 21:4.

 N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-eme ka ihe gbanwee n’ụwa niile. Baịbụl buru amụma na “agha na akụkọ agha” juru ebe niile taa so n’ihe ndị a ga-eji ama oge anyị a. (Matiu 24:6) Ihe ndị a na ihe ndị ọzọ na-emenụ na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ” nke ọchịchị ụmụ mmadụ.​—2 Timoti 3:1.