Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Left: Olena Yefremkina/stock.adobe.com; center: lunamarina/stock.adobe.com; right: Rido/stock.adobe.com

NA-ECHENỤ NCHE!

Ònye Ka Ị Ga-atụkwasị Obi?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ònye Ka Ị Ga-atụkwasị Obi?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Obi na-agbawa ndị mmadụ ma ndị ha chere na ha nwere ike ịtụkwasị obi mee ihe gosiri na e kwesịghị ịtụkwasị ha obi. Ọtụtụ ndị akwụsịla ịtụkwasị ndị a obi:

  •   ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ ndị na-achọ ihe ga-abara onwe ha uru kama ịchọ ihe ga-abara ndị mmadụ uru.

  •   ụlọ mgbasa ozi ndị na-anaghị akọ ihe otú o si mee, gharakwa ịna-ekwu ihe bụ́ eziokwu.

  •   ndị sayensị bụ́ ndị na-anaghị eme ihe ga-abara ndị mmadụ uru.

  •   ndị isi okpukpe bụ́ ndị na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kama ịna-akụziri ndị mmmadụ eziokwu gbasara Chineke.

 Ọ dị mma na ndị mmadụ anaghịzi atụkwasị onye ọ bụla ha hụrụ obi. Baịbụl kwuru, sị:

  •   “Unu atụkwasịla ndị isi obi, unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye na-enweghị ike ịzọpụta mmadụ.”​—Abụ Ọma 146:3.

Onye ị ga-atụkwasịli obi

  Baịbụl kwuru na e nwere onye ị ga-atụkwasili obi, ya bụ, Jizọs Kraịst. Anyị ekwesịghị iwere Jizọs naanị ka ezigbo mmadụ dịrị ndụ ọtụtụ afọ gara aga. Chineke họpụtara ya ka ọ bụrụ eze, “Alaeze ya agaghịkwa agwụ agwụ.” (Luk 1:32, 33) Jizọs bụ Eze Alaeze Chineke, ya bụ, ọchịchị na-achị ugbu a n’eluigwe.​—Matiu 6:10.