Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Chineke Si Elekọta Ndị Ntị Chiri

Otú Chineke Si Elekọta Ndị Ntị Chiri

 Ndị ntị chiri n’ụwa niile ugbu a dị ihe dị ka nde mmadụ iri asaa (70,000,000). Ọtụtụ n’ime ha na-ejikwa asụsụ ndị ogbi ekwu okwu. Asụsụ ndị ogbi e nwere karịrị narị abụọ (200). Ma, ọ dị mwute na ndị mmadụ na-akpasokarị ndị ntị chiri àgwà ọjọọ. Lee ihe ụfọdụ gosiri ya:

  •   Òtù Na-ahụ Maka Ndị Ntị Chiri n’Amerịka kwuru, sị: “N’ụwa niile, a na-elegharakarị ndị ntị chiri na ndị ntị ike anya.”

  •   Òtù Na-ahụ Maka Ndị Ntị Chiri n’Ụwa Niile kwuru, sị: “Ndị ntị chiri ndị bi ná mba ndị ka na-emepe emepe so ná ndị kacha daa ogbenye n’ụwa. Ọ na-esikwa ike ha agaa akwụkwọ, nweta ọrụ, ma ọ bụ nụ ihe ndị na-eme n’obodo.”

 Olee otú Chineke si ele ndị ntị chiri anya? Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ndị ntị chiri? Oleekwanụ otú Ndịàmà Jehova si enyere ha aka taa?

Otú Chineke Si Ele Ndị Ntị Chiri Anya

 Baịbụl gosiri na ihe gbasara ndị ntị chiri na-emetụ Jehova a Chineke n’obi. Ọ chọrọ ka a na-akpaso ha àgwà ọma nakwa ka ha rite uru n’ihe ọ na-akụziri anyị.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Akpọla onye ntị chiri iyi.”​—Levitikọs 19:14.

 Ihe Ọ Pụtara: Iwu Jehova nyere ndị Izrel n’oge ochie mere ka a ghara ịnapụ ndị ntị chiri ihe ruuru ha.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.”​—Ọrụ Ndịozi 10:34.

 Ihe Ọ Pụtara: Ihe gbasara mmadụ niile na-emetụ Jehova n’obi n’agbanyeghị omenala ha, ihe ndị mere ná ndụ ha, na asụsụ ha, ma ndị ntị chiri.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Jizọs wee malite ijegharị . . . , na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke.”​—Matiu 9:35.

 Ihe Ọ Pụtara: Jizọs bịara n’ụwa ịkụziri ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke na ihe ọ ga-emere mmadụ niile, ma ndị ntị chiri.​—Matiu 6:10.

 Ihe Baịbụl kwuru: Jizọs medịrị ‘ka ndị ntị chiri nụ ihe, meekwa ka ndị ogbi kwuo okwu.’​—Mak 7:37.

 Ihe Ọ Pụtara: Jizọs gosiri ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị mgbe ndị ntị chiri ga-anụwa ihe, ndị ogbi ana-ekwukwa okwu. Mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube ahụ, o ji aka gwa nwoke ahụ ntị chiri okwu tupu ya mee ka ọ nụwa ihe ma kwuwe okwu.​—Mak 7:31-35.

 Ihe Baịbụl kwuru: ‘A ga-emeghe ntị ndị ntị chiri.’​—Aịzaya 35:5.

 Ihe Ọ Pụtara: Jehova buru amụma na ndị ntị chiri ga-anụ ihe.​—Aịzaya 29:18.

Otú Ndịàmà Jehova Si Enyere Ndị Ntị Chiri Aka Taa

 N’ụwa niile, Ndịàmà Jehova na-ezi ndị ntị chiri ozi ọma si n’aka Chineke nke na-eme ka ha nwee olileanya. Olee otú anyị si arụ ọrụ a? Anyị na-ebipụta Baịbụl na-emepụtakwa vidio n’asụsụ ndị ogbi karịrị otu narị (100). Anyị na-ejikwa asụsụ ndị ogbi amụrụ ndị ntị chiri ihe, jirikwa ya na-eme ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ebe ihe ndị a bụ otú Chineke si enyere ndị nti chiri aka, anyị anaghị ana onye ọ bụla ego. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jizọs nyere iwu, sị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.”​—Matiu 10:8.

 I nwere ike inweta ihe ndị ahụ n’Ịntanet ma ọ bụ si n’ebe a were ha:

 JW.ORG. Pịa aka n’ebe e si agbanwe asụsụ n’elu, họrọzie asụsụ ndị ogbi nke ị chọrọ.

 JW Library Sign Language app. Tinye app a n’ekwentị ma ọ bụ na kọmputa gị. Ị gaghị akwụ ụgwọ. Ị ga-enwezi ike ile vidio ndị ogbi ma ọ bụkwanụ were ha.

Olee Ihe Ndị E Ji Amụ Baịbụl Anyi Wepụtarala?

 Baịbụl ndị ogbi. Baịbụl ndị ogbi mbụ e wepụtara n’ụwa niile bụ Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka (New World Translation of the Holy Scriptures in American Sign Language). E nwere Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke zuru ezu na nke na-ezughị ezu ugbu a n’ọtụtụ asụsụ ndị ogbi. Anyị na-ewepụtakwa ọtụtụ n’asụsụ ndị ogbi ndị ọzọ kwa afọ. (Ị chọọ ịhụ asụsụ ndị ogbi ndị ahụ ma ọ bụ chọọ ikiri Baịbụl n’Ịntanet, gaa n’igbe bụ́: “Baịbụl  Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’Asụsụ Ndị Ogbi.”)

  •   Lee vidio isiokwu ya bụ The Complete New World Translation Is Available in ASL ka ị hụ mbọ anyi na-agba iji wepụta Baịbụl n’asụsu ndị ogbi.

  •   Tinye JW Library Sign Language app n’ekwentị gị ka ịgụ Baịbụl n’asụsụ ndị ogbi tọọ gị ezigbo ụtọ. Na app ahụ, i nwere ike ị họrọ amaokwu Baịbụl ị chọrọ ile na Baịbụl ndị ogbi nke ọ bụla.

  •   Dmytro na Vita bụ di na nwunye ntị chiri ma ụmụ ha na-anụ ihe. Legodị otú ile Baịbụl ndị ogbi kwa ụbọchị si abara ha niile uru.

 Vidio ndị e ji akụzi Baịbụl. Ndịàmà Jehova emepụtala vidio dị iche iche n’asụsụ ndị ogbi ndị na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe Baịbụl kwuru gbasara isiokwu ndị a, ma na-eme ha eme:

 Gị na mmadụ ịna-amụ Baịbụl. Onye na-asụ asụsụ ndị ogbi ga-enyere gị aka ịmụ Baịbụl, a ga na-amụ ya otú ọ ga-adịrị gị mfe ịna-aghọta ihe unu na-amụ. Kwuo ka e gosi gị otú e si eme ya, a gaghị ana gị ego.

 Jeson Senajonon bi na Filipinz. Legodị otú Baịbụl anyị na ya na-amụ si nyere ya aka ka ya na Chineke bụrụ ezigbo enyi.

 Mario Antúnez bụbu ụkọchukwu n’otu chọọchị dị na Họnduras. Lee vidio bụ́ “I Had More Questions Than Answers,” ka ị hụ ihe o kwuru banyere otú o si nweta azịza ajụjụ ndị gbasara Baịbụl ọ nọ na-ajụ.

 Ọmụmụ ihe anyị na mgbakọ dị iche iche. N’ebe dị iche iche n’ụwa, anyị nwere ìgwè ma ọ bụ ọgbakọ dị iche iche ebe ndị ntị chiri na-ezukọ kwa izu, jiri asụsụ ndị ogbi na-amụ ihe ma na-efe Chineke. Anyị na-enwekwa mgbakọ kwa afọ n’asụsụ ndị ogbi iji mụọ Baịbụl. N’ọmụmụ ihe anyị nakwa ná mgbakọ anyị, anyị na-enwe ndị na-eji aka ha asụgharịrị ndị ntị chiri ma kpuokwa ìsì ihe a na-ekwu. Anyị na-ebipụtakwa akwụkwọ ndị ìsì. Anyị anaghịkwa ere ha ere.

 José Luis Ayala bi na Mexico. Ntị chiri ya mgbe a mụrụ ya, ya emechaakwa kpuo ìsì. Chọpụta otú e si nyere ya aka ya ana-akụziri ndị ọzọ Baịbụl nke ọma.

a Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ “Ònye bụ Jehova?