Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-emete Ndị Ọzọ Enyị Ka Owu Kwụsị Ịna-ama Gị​—Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere Gị Aka

Na-emete Ndị Ọzọ Enyị Ka Owu Kwụsị Ịna-ama Gị​—Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere Gị Aka

 N’afọ 2023, ndị ọrụ ahụ́ ike chọpụtara na owu ọmụma bụzi ezigbo nsogbu ha kwesịrị ilebara anya. Ma, hà ga-akwụsịli owu ọmụma?

  •   Onyeisi ndị dọkịta na-awa ahụ́ n’Amerịka, bụ́ Vivek Murthy, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na owu na-ama anyị ma ọ bụkwanụ na anyị na-anọrọ onwe anyị, anyị nwere ike ịkpatara onwe anyị nsogbu, anyị agaghịkwa na-enwe obi ụtọ. Ọ dị anyị n’aka ime ihe banyere ya.” Ihe dị ka gịnị? Dọkịta ahụ kwuru, sị: “Anyị nwere ike ịna-eme ụmụ obere ihe kwa ụbọchị iji mee ka anyị na ndị ọzọ na-adịkwu ná mma.” a

 Ọ bụghị naanị mmadụ ịnọrọ onwe ya na-akpata owu ọmụma. E nwere ndị na-anọ ebe ìgwè mmadụ nọ, owu ana-amakwa ha. Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya na-akpatara anyị owu ọmụma, Baịbụl nwere ike inyere anyị aka. Ọ gwara anyị ihe ndị bara uru anyị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ na-adịkwu ná mma, ime ihe ndị ahụ nwekwara ike ime ka owu kwụsị ịna-ama anyị.

Ihe Baịbụl kwuru ndị nwere ike inyere anyị aka

 Mụta gị na ndị ọzọ ịna-ekwurịta okwu. Ihe a pụtara na anyị ekwesịghị naanị ịna-akọrọ ndị ọzọ otú obi dị anyị, kama, anyị kwesịkwara ịna-ege ha ntị ma ha gwawa anyị otú obi dị ha. Ọ bụrụ na ị na-egosi ndị ọzọ na i ji ha kpọrọ ihe, gị na ha ga na-adịkwu ná mma.

  •   Ihe Baịbụl kwuru: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.”​—Ndị Filipaị 2:4.

 Mete ndị dị iche iche enyi. Na-emete ụdị ndị dị iche iche enyi, ma ndị tọrọ gị ma ndị ị tọrọ ma ndị omenala ha dị iche na nke unu ma ndị si mba ọzọ.

  •   Ihe Baịbụl kwuru: ‘Jirinụ obi unu niile hụ (ndị mmadụ) n’anya.’​—2 Ndị Kọrịnt 6:13.

 Ị chọọ ịmatakwu otú ị ga-esi na-emete ezigbo ndị enyi, gụọ isiokwu bụ́ “Imejụ Agụụ Anyị Na-enwe Maka Ndị Enyị.”

a E nwetara ihe a n’akwụkwọ bụ́ Our Epidemic of Loneliness and Isolation: The U.S. Surgeon General’s Advisory on the Healing Effects of Social Connection and Community, 2023.