Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Francesco Carta fotografo/Moment via Getty Images

Otú Owu Ọmụma Si Na-akakwu Njọ​—Ihe Baịbụl Kwuru

Otú Owu Ọmụma Si Na-akakwu Njọ​—Ihe Baịbụl Kwuru

 Nchọpụta e mere na nso nso a n’ụwa niile a gosiri na owu na-ama ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla.

  •   Chido Mpemba, bụ́ otu n’ime ndị isi na Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike, kwuru, sị: “Mmadụ nwere ike na-anọrọ onwe ya, gharakwa inwe ndị enyi n’agbanyeghị afọ ole ọ dị, ebe ọ nọ, ma ọ bụ onye ọ bụ.”

 Ọ bụghị naanị ndị agadi ma ọ bụ ndị na-anọkarị naanị ha ka owu nwere ike ịma, dị ka ọtụtụ ndị na-eche, kama, o nwekwara ike ịma ndị na-eto eto, ndị ahụ́ dị, ndị ihe na-agaziri ná ndụ, nakwa ndị lụrụla di ma ọ bụ nwunye. Mmadụ ịnọrọ onwe ya na owu ọmụma nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa ma ọ bụ mee ka obi na-ajọ ya njọ.

  •   Vivek Murthy, bụ́ onyeisi ndị dọkịta na-awa ahụ́ n’Amerịka, kwuru, sị: “Ọ bụghị naanị obi ịjọ mmadụ njọ ka owu ọmụma na-akpata, kama, mmadụ ole ịṅụ sịga iri na ise n’ụbọchị nwere ike igbu ka mmadụ ịnọrọ onwe ya nwekwara ike igbu.”

Ihe Baịbụl Kwuru

 Onye kere anyị achọghị ka anyị na-anọrọ onwe anyị. Ihe Chineke bu n’obi kemgbe ụwa bụ ka ụmụ mmadụ na ibe ha na-emekọ ihe ma dịrị n’ezigbo mma.

  •   Ihe Baịbụl kwuru: “Chineke wee sị: ‘Ọ dịghị mma ka nwoke a nọrọ naanị ya.’”​—Jenesis 2:18.

 Chineke chọrọ ka anyị na ya dịrị ná mma. Ọ sịrị na ọ ga-abịaru anyị nso ma ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ ka anyị ruo ya nso.​—Jems 4:8.

  •   Ihe Baịbụl kwuru: “Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha na-enwe obi ụtọ, n’ihi na Alaeze eluigwe bụ nke ha.”​—Matiu 5:3.

 Chineke chọrọ ka anyị na ndị ọzọ nọkọọ na-efe ya. Ime ihe a ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ.

  •   Ihe Baịbụl kwuru: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ. Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị . . . kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume.”​—Ndị Hibru 10:24, 25.

 Ị chọọ ịmatakwu ihe i kwesịrị iji gbaa mbọ ka owu ghara ịna-ama gị, gụọ isiokwu bụ́ “Loneliness in a World of Mass Connection.”