Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Justin Paget/​Stone via Getty Images

Owu Ọmụma Bụzi Nsogbu Juru Ebe Niile​—Olee Otú I Nwere Ike Isi Merie Ya?

Owu Ọmụma Bụzi Nsogbu Juru Ebe Niile​—Olee Otú I Nwere Ike Isi Merie Ya?
  •   Otu akwụkwọ na-ekwu maka ndị owu na-ama na ndị na-anọ naanị ha n’Amerịka kwuru na ihe dị ka ọkara ndị toro eto n’Amerịka kwuru na owu na-ama ha, karịchaa ndị nọ n’agbata afọ iri na asatọ na iri abụọ na ise.

  •   N’abalị 15 n’ọnwa Nọvemba afọ 2023, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike, mara ọkwa na ha ahọpụtala ndị ga na-arụ otu ọrụ dị ezigbo mkpa, ya bụ, ilekọta na ịchọpụta ihe ụfọdụ gbasara ndị owu na-ama. Ha ga na-agbakwa ndị mmadụ ume ka ha na ndị ọzo na-adị ná mma, chọpụtakwa ụzọ ndị ka mma a ga-esi na-agwọ ndị owu na-ama ná mba dị iche iche, ma ná mba ndị dara ogbenye.

 Baịbụl kwuru ihe ndị anyị ga-eme ka anyị na ndị mmadụ na-adị ná mma, ka owu wee ghara ịna-ama anyị.

Ihe Baịbụl kwuru ndị nwere ike inyere anyị aka

 Kwụsịlata ime ihe ndị na-eme ka ị na-anọkarị iche.Otu n’ime ha bụ ịna-anọkarị n’ebe ndị mmadụ na-akparịta ụka n’Ịntanet. Kama ịna-eme otú ahụ, gbalịa ka gi na ndị mmadụ na-akparịta ihu na ihu, si otú ahụ mete ezigbo ndị enyi.

  •   Ihe Baịbụl kwuru: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”​—Ilu 17:17.

 Chọta otú ị ga-esi na-enyere ndị ọzọ aka.Ọ bụru na ị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, gị na ha ga-adị n’ezigbo mma, obi ga na-adịkwa gị ụtọ.

  •   Ihe Baịbụl kwuru: “A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”​—Ọrụ Ndịozi 20:35.

 Gaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ka ị hụ ọtụtụ isiokwu ndị si na Baịbụl, ndị ga-enyere gị aka imete ezigbo ndị enyi.