Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Rui Almeida Fotografia/Moment via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Tigbuo Zọgbuo A Na-eme n’Ihi Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Tigbuo Zọgbuo A Na-eme n’Ihi Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 A na-emezi tigbuo zọgbuo n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ebe niile n’ụwa, ihe a emeekwala ka ndị mmadụ chịrị obi n’aka.

  •   Na Meziko, e gburu mmadụ iri atọ na itoolu ndị so azọ ọchịchị ná ntụliaka nke afọ 2023 na 2024. Nke a bụkwa mbụ a na-egburu mmadụ ole a. Ogbugbu e gburu ndị a nakwa tigbuo zọgbuo ndị ọzọ a na-eme n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị tụrụ ndị mmadụ n’anya, meekwa ka uche ha pụọ ná ntụliaka e mere n’oge ahụ.

  •   Na nso nso a, e nweela ọtụtụ tigbuo zọgbuo e mere n’oge a n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Yurop, ma mgbagbu a nwara ịgbagbu osote onyeisi ala Slovakịa n’abalị iri na ise n’ọnwa Mee afọ 2024.

  •   Ụjọ ejidela ndị Amerịka n’ihi mgbagbu a nwara ịgbagbu Donald Trump, bụ́ onye bụbu onyeisi ala ha, n’abalị iri na atọ n’ọnwa Julaị afọ 2024.

 Gịnị mere e ji enwe ọtụtụ tigbuo zọgbuo n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị? È nwere mgbe ọ ga-akwụsị? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Mgbe a ga-akwụsị tigbuo zọgbuo ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpata

 Baịbụl buru amụma na n’oge anyị a, nke ọ kpọrọ “oge ikpeazụ,” ọtụtụ ndị ga na-akpa àgwà ndị na-akpata tigbuo zọgbuo na esemokwu.

  •   “Oge ikpeazụ ga-adị oké egwu, taakwa akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ . . . ndị na-anaghị ekele onye meere ha ihe, ndị na-agharịpụ ndị ọzọ, . . . ndị na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla, . . . ndị tigbuo zọgbuo, . . . ndị na-eme ndị enyi ha ihe ọjọọ, ndị isi ike, ndị onwe ha na-ebu isi.”—2 Timoti 3:1-4.

 Baịbụl bukwara amụma na n’oge a, a ga-enwe ọgba aghara ndị dị ka inupụrụ ndị ọchịchị isi na tigbuo zọgbuo n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Luk 21:9) Ma tigbuo zọgbuo na esemokwu ndị a agaghị adị ruo mgbe ebighị ebi.

Mgbe a ga-akwụsị tigbuo zọgbuo ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpata

 Baịbụl kwuru na Chineke ga-eji Alaeze ya nke dị n’eluigwe dochie ọchịchị ụmụ mmadụ.

  •   “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze . . . malite ịchị. Alaeze ahụ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma naanị ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.

 Alaeze Chineke ga-eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu n’eziokwu, udo adịkwa ebe niile n’ụwa.

  •   Ọ bụ Jizọs Kraịst ga-achị n’Alaeze ahụ. A kpọrọ ya “Onyeisi Udo,” ọ ga-emekwa ka udo ghara ịkwụsị ịdị.—Aịzaya 9:6, 7.

  •   Ndị Alaeze ahụ na-achị ugbu a na-amụta otú ha na ibe ha ga-esi na-adị n’udo. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi. Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha. Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.”—Aịzaya 2:3, 4.

 Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe a, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Alaeze Chineke Ga-eme?” leekwa vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke?