Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NA-ECHENỤ NCHE!

Agha A Na-alụ na Yukren Emeela Ka Nri Dịkwuo Ụkọ n’Ụwa Niile

Agha A Na-alụ na Yukren Emeela Ka Nri Dịkwuo Ụkọ n’Ụwa Niile

 N’abalị iri na itoolu n’ọnwa Mee afọ 2022, ihe karịrị mmadụ iri asaa na ise a na-anụ aha ha n’ọchịchị gwara Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Udo na “a ka na-ekwu na ọrịa koronavaịrọs na mgbanwe ihu ígwé emeela ka nri dị ụkọ n’ụwa niile, agha a na-alụ na Yukren emeela ka nri dịkwuo ụkọ.” O teghịkwa aka, otu akwụkwọ a na-akpọ The Economist ekwuo na “agha na-achọ ime ka agụụ gụgbuo imirikitimi ụmụ mmadụ n’ụwa a nwere ọtụtụ nsogbu ha na ndị mmadụ na-alụ.” Baịbụl kwuru na a ga-enwe ụdị ụkọ nri a n’oge anyị. Ma, o kwukwara ihe ga-enyere anyị aka ma o mee.

Baịbụl buru amụma na a ga-enwe ụkọ nri

  •    Jizọs buru amụma, sị: “Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha. A ga-enwekwa ụkọ nri.”​—Matiu 24:7.

  •    Na Baịbụl, akwụkwọ Mkpughe ji ndị na-agba ịnyịnya mee ihe atụ. Ha dị anọ. Otu n’ime ha nọchiri anya agha. Nke na-eso ya nọchiri anya ụkọ nri, ya bụ, oge a ga na-atụ nri atụ̀, ya adịrịkwa ezigbo ọnụ. Ọ sịrị: “Ahụkwara m ịnyịnya ojii, nke onye na-agba ya ji ihe gbara mkpị e ji atụ̀ ihe n’aka ya. Anụrụ m ihe dị ka olu . . . Olu ahụ sịrị: ‘A na-ere otu kwọt nke ọka wit otu mkpụrụ ego dinarịọs. A na-erekwa kwọt atọ nke ọka bali otu mkpụrụ ego dinarịọs.’”​—Mkpughe 6:5, 6.

 Amụma ndị a Baịbụl buru gbasara ụkọ nri na-emezu n’oge anyị a Baịbụl kpọrọ “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) Ị chọọ ịmatakwu gbasara “oge ikpeazụ” na ndị ahụ na-agba ịnyịnya anọ e kwuru gbasara ha n’akwụkwọ Mkpughe, lee vidio aha ya bụ The World Has Changed Since 1914, gụọkwa isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ Nọchiri Anya Ha?

Olee otú Baịbụl si enye aka?

  •    Baịbụl kwuru ihe ga-enyere anyị aka ma anyị nwee nsogbu ndị dị ka nri ịdị oké ọnụ ma ọ bụdị nri ịdị ụkọ. Ị ga-ahụ ụfọdụ n’ime ihe ndị o kwuru ma ị gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Ga-enyere Gị Aka ma Ego Na-abata Gị Aka Dịzie Obere.”

  •    Baịbụl kwukwara ihe mere ka anyị nwee olileanya na ihe ga-aka mma. O kwuru na a ga-enwe oge “nri ga-eju n’ụwa,” bụrụkwa atụrụ tawa maka onye ọ bụla. (Abụ Ọma 72:16) Ị chọọ ịmatakwu ihe ọma ndị Baịbụl kwuru ga-eme n’ọdịnihu nakwa ihe mere i ji kwesị ikwere na ha, gụọ isiokwu bụ́ “Olileanya E Ji n’Aka na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu.”