Abụ nke 62
Ònye Ka Anyị Bụ nke Ya?
1. Ònye k’ị bụ nke ya?
Olee chi nke ị n’efe?
Ọ bụ ony’ị n’efe bụ nna gị ukwu.
Ọ bụ chi gị; ị n’efe ya.
Ị gagh’efe chi abụọ;
Ị gagh’eji obi gị dum
Hụ nna ukwu abụọ n’anya otu mgbe.
Ị g’emejọ ha abụọ.
2. Ònye k’ị bụ nke ya?
Olee chi nke ị g’efe?
Otu chi ụgha, otu ezi Chi,
Ị g’ahọrọ nk’ị g’efe.
Ọ̀ bụ Siza nk’ụwa a
Ka ị ga n’ef’ofufe?
K’ị̀ g’efe ezi Chineke ugbu a,
N’em’uche ya mgbe niile?
3. Ònye ka m bụ nke ya?
Jaa ka m g’eruber’isi.
M g’efe Nna m nk’el’igwe;
M g’emezu nkwa m niile.
Ọ zụrụ m oké ọnụ;
M ga n’ahụ ya n’anya.
O ji ọnwụ Ọkpara ya gbapụta m;
M g’asọpụr’aha ya.
(Gụọkwa Jọsh. 24:15; Ọma 116:14, 18; 2 Tim. 2:19.)