Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 80

Ịdị Mma

Ịdị Mma

(Abụ Ọma 119:⁠66)

1. Ịhụ ịdị mma Jehova

N’eme k’anyị nwee ọṅụ.

Ọ bụ Nn’anyị bi n’el’igwe,

Ọ dị mma n’ụzọ ya dum,

N’em’ebere na amara

Nke n’ekwesịgh’anyị;

Anyị kwesịrị ife ya,

Jir’ọṅụ n’ej’ozi ya.

2. O ker’anyị n’oyiyi ya

K’anyị nwee ik’ịmụta

Àgw’ọma niile o nwere,

Ma ṅomie ịdị mma ya.

K’anyị n’eto n’ịdị mma ya,

K’anyị nwee àgw’ọma ya,

N’arịọ ka o nye anyị ’mụọ nsọ,

K’anyị mịa mkpụrụ ya.

3. K’anyị n’emere ụmụnna,

N’ezinụl’okwukw’anyị,

Amara nke pụrụ iche,

Meere ndị niile ih’ọma.

Mgbe anyị n’ezi ndị ’madụ

Ozi Al’eze Chineke,

K’anyị ghara ịkpa ókè;

K’ịdị mm’anyị zuo ezu.