Abụ nke 110
Ọrụ Dị Ebube nke Chineke
1. O, Jaa, ị ma ụra m na nteta m,
Ndin’ala m nakwa mbilite m.
Ị n’enyocha ma echiche m ma obi m,
Ị makwa okwu ọnụ m na
ije ụkwụ m.
Ị hụrụ mgbe m nọ n’afọ nne m,
Ọkpụkpụ m ezogh’ezo n’ihu gị.
Ị hụr’ahụ́ m; i dere ya n’akwụkwọ.
M n’eto ọrụ ebube gị
na ike gị.
Amamihe gị dị ukwuu, dịkwa egwu,
Mkpụr’obi m maara nke a nk’ọma.
M tụọ egwu n’ọchịchịrị g’ekpuchi m,
M g’enweta ’mụọ nsọ gị n’eb’ahụ.
Jehova, ọ̀ dị ebe m g’ezo
M’ọ bụ kpuchie onwe m k’ị ghar’ịhụ m?
Ọ bụghị n’elu m’ọ bụ n’ime ili
M’ọ bụ n’ọchịchịrị m’ọ bụ n’osimiri.
(Gụọkwa Ọma 66:3; 94:19; Jere. 17:10.)