Abụ nke 132
Abụ Mmeri
1. Bụkuo Jaa abụ. E buliwo aha ukwu y’elu.
Ọ tụbara nd’iro ya N’oké osimiri.
Toonụ Jehova; Naanị ya pụr’im’ihe niile.
Jehova bụ aha ya; O nweela ezi mmeri.
(KORỌS)
Jehova, bụ́ Onye Kach’elu,
Onye n’adịghị agbanwe agbanwe,
Ị g’ebibi nd’iro gị n’isi nso,
Ma mee ka aha gị dị nsọ.
2. Lee ka mba niile N’emegide Jehova, bụ́ Eze.
Ha d’ike karịa Fero, M’ihere g’eme ha.
A g’ebibi ha; Ha niile g’anwụ n’Amagedọn.
’Madụ niile g’ama Na Jehova bụ aha ya.
(KORỌS)
Jehova, bụ́ Onye Kach’elu,
Onye n’adịghị agbanwe agbanwe,
Ị g’ebibi nd’iro gị n’isi nso,
Ma mee ka aha gị dị nsọ.
(Gụọkwa Ọma 2:2, 9; 92:8; Mal. 3:6; Mkpu. 16:16.)