Abụ nke 51
Anyị Na-arapara Jehova n’Ahụ́
1. Ọkaakaa, Jehova, kwesịr’otuto niile.
Ọ n’ekp’ikpe zir’ezi n’ihe niil’ọ n’eme.
Ọ dịghị okwu ya g’abụ ihe efu.
A’yị nọ Jehova nso, rapara ya n’ahụ́;
Ịnabat’ọchịchị ya g’abar’anyị uru.
2. Eziokwu n’ez’ikpe bụ ntọala och’eze ya.
Ebe obibi ya jupụtara n’ebube.
Ndị dị umeala n’az’òkù ọ kpọrọ ha.
Anyị n’arapar’Onye kach’elu n’ahụ́;
Ọ bụ naanị ya k’anyị kwesịrị ife.
3. El’igwe nk’el’igwe enwegh’ike ịba ya.
Ọ dịgh’ony’iro g’emeri m’ọ bụ gbochie ya.
Obi sir’any’ike n’ọ g’emezu nkwa ya.
Anyị chọrọ ime uche Chinek’anyị,
K’anyị jir’obi anyị niile hụ ya n’anya.
(Gụọkwa Diut. 4:4; 30:20; 2 Eze 18:6; Ọma 89:14.)