Abụ nke 133
Chọọ Chineke Ka Ọ Napụta Gị
1. Mba dum ji otu obi
N’emegide Ọkpara Jaa.
Og’eruola ka Chineke
Kwụsị ọchịchị ’madụ.
Ha dum achịzuola;
Al’eze Jaa ga n’adị.
Kraịst g’ebibi nd’iro ya n’ụwa.
Ọ gagh’egbukwa oge.
(KORỌS)
Chọọ Jaa ka ọ napụta gị,
Jiri ob’ike n’achọ ya.
Chọọ ezi omume,
Tụkwasị y’obi,
N’akwadokwa ọchịchị ya.
Ọ g’eji aka ya d’ike
Napụtakwa gị.
2. ’Madụ dum g’ekpebi
Ma hà g’anụ ozi ọma.
A’yị n’ahapụ ka ha kpebie
Ma hà g’anụ m’ọ bụ jụ.
Ọnwụnwa sie ike,
Anyị agagh’at’ụjọ.
Jehova n’elekọta ndị ya;
A’yị tikuo ya, ọ g’anụ.
(KORỌS)
Chọọ Jaa ka ọ napụta gị,
Jiri ob’ike n’achọ ya.
Chọọ ezi omume,
Tụkwasị y’obi,
N’akwadokwa ọchịchị ya.
Ọ g’eji aka ya d’ike
Napụtakwa gị.
(Gụọkwa 1 Sam. 2:9; Ọma 2:2, 3, 9; Ilu 2:8; Mat. 6:33.)