Abụ nke 70
“Chọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa”
1. Taa, a’yị kwesịr’inwe nghọta, k’anyị
Mat’ihe ndị bụ́ eziokwu,
K’anyị matakwa ihe ndị ka mkpa
N’ihe a’yị kwesịr’ime!
N’em’ez’ihe; Hapụ ih’ọjọọ,
Ka Jaa ṅụrịa;
Ị g’enwet’ọṅụ dị ukwuu. Kpe’ekpere;
N’amụ ihe.
K’anyị n’em’ihe ndị a dị mkpa.
2. E nweghị ihe dị mkpa karịa
Izi ozi ọm’Al’eze,
Ịchọta ụmụ atụrụ Nn’anyị, mee
Ka ha soro ụzọ ya.
A’yị g’agwa ha, Ka ha wee nụ.
K’anyị hụ ndị
Agbat’obi n’anya, ka ha ghọta.
Napụta ha!
Ikwus’ozi ọma dị oké mkpa.
3. Okwukw’anyị g’esi ike m’anyị
N’eme ihe ndị dị mkpa.
A’yị g’enw’udo karịr’uche mmadụ,
Nweekwa ezi olil’anya.
Anyị g’enwe ezi ndị enyi
Na ịhụnanya.
Ọ bụ ezi ngọzi m’anyị mụta,
M’anyị ghọta,
N’emekwa ihe ndị dị mkpa!
(Gụọkwa Ọma 97:10; Mat. 22:37; Jọn 21:15-17; Ọrụ 10:42.)