Abụ nke 12
Chineke Kwere Nkwa Ndụ Ebighị Ebi
1. Jaa kwere nkwa ndụ ebigh’ebi.
Ụw’anyị g’adịgide.
‘Ndị umeala g’ebi n’ụwa.’
Ọ g’emezurịrị.
(KORỌS)
Jisi’ike k’i nweta
Ndụ ebigh’ebi.
Nkwa Jaa bụ eziokwu.
Okwu ya g’eme.
2. Paradaịs ahụ g’ezu okè;
Anyị g’enwer’onw’anyị.
Jehova g’eme ka anyị
Nweta udo n’ụwa.
(KORỌS)
Jisi’ike k’i nweta
Ndụ ebigh’ebi.
Nkwa Jaa bụ eziokwu.
Okwu ya g’eme.
3. N’oge mbilite n’ọnwụ,
A g’ewepụ ir’uju.
Jaa g’emer’anyị ebere,
Hichaa anya ’miri.
(KORỌS)
Jisi’ike k’i nweta
Ndụ ebigh’ebi.
Nkwa Jaa bụ eziokwu.
Okwu ya g’eme.
(Gụọkwa Aịza. 25:8; Luk 23:43; Jọn 11:25; Mkpu. 21:4.)