Abụ nke 22
“Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”
1. Jehova bụ Onye n’azụ m;
Gịnị g’eme ka m tụ’egwu?
Ọ n’azụ atụrụ ya nk’ọma,
Ọ gagh’echefu ndị ya.
Ọ n’edu m n’akụkụ ’miri,
Gọzie m, k’obi ruo m ala.
Ọ n’edukwa m n’ihi aha ya
N’ụzọ nke ezi omume.
Ọ n’edukwa m n’ihi aha ya
N’ụzọ nke ezi omume.
2. M jee ije n’ọchịchịrị,
M gaghị atụ egwu.
Onye N’azụ m nọ nso mgbe dum;
Mkpanaka ya n’edu m.
Ọ n’ete isi mụ ’manụ;
Ọ gbajur’iko m n’ọnụ.
Obiọma Chineke ga n’eso m,
M g’ebikwa n’ụlọ ya.
Obiọma Chineke ga n’eso m,
M g’ebikwa n’ụlọ ya.
3. Onye n’azụ m hụrụ m n’anya!
M g’eji abụ too ya.
M g’akọrọ ndị yir’atụrụ
Akụkọ obiọma ya.
M g’eso Okwu ya mgbe dum,
N’eje ije n’ụzọ ya.
Ozi ya bụ akụ̀ bar’uru,
M g’eje ya kw’ụbọchị.
Ozi ya bụ akụ̀ bar’uru,
M g’eje ya kw’ụbọchị.