Abụ nke 38
Tụkwasị Jehova Ibu Arọ Gị
1. Biko, Jehova, gee mụ ntị,
Ma mee ka m chọta gị.
Biko, nụr’ekpere m ma za m;
Mee ka m ghar’ịtụ egwu.
(KORỌS)
Tụkwasị Jehov’ibu gị;
Y’onwe ya g’akwado gị.
Ọ gaghị ekwe ka ị daa,
Ọ g’eme k’ị kwụrụ chịm.
2. A sị na m nwere nku nduru,
M g’efeg’ebe dị jụụ,
Ka ndị ọjọọ ghar’inweta m,
N’okwu ọjọọ ha n’ekwu.
(KORỌS)
Tụkwasị Jehov’ibu gị;
Y’onwe ya g’akwado gị.
Ọ gaghị ekwe ka ị daa,
Ọ g’eme k’ị kwụrụ chịm.
3. Aga m akpọku Jehova,
Rịọ ya ka ọ n’echebe m.
Ọ n’eny’udo n’oge nsogbu,
N’enye ndị umeala ike.
(KORỌS)
Tụkwasị Jehov’ibu gị;
Y’onwe ya g’akwado gị.
Ọ gaghị ekwe ka ị daa,
Ọ g’eme k’ị kwụrụ chịm.