Bụkuo Jehova Abụ—Abụ Ọhụrụ
Soro bụọ abụ ọhụrụ ndị a e ji eto Jehova Chineke ma na-efe ya ofufe. Danloduo ha na mkpụrụ okwu ha ma mụọ ha ka ị mụta ịbụ ha ọfụma.
ABỤ 136
Alaeze Chineke Na-achị—Ya Bịawa!
Ọmarịcha abụ Alaeze e ji eto Jehova Chineke iji gosi na Kraịst Jizọs achịwala n’Alaeze Chineke.
ABỤ 137
Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu
Soro bụọ abụ a e ji arịọ Jehova Chineke ka o nye anyị obi ike ịgbara aha ya àmà n’atụghị egwu.
ABỤ 138
Jehova Bụ Aha Gị
Too aha Jehova dị́ ebube, meekwa ka mmadụ niile mara na ọ bụ ya bụ Ọkaakaa.
ABỤ 139
Na-ezi Ha Ka Ha Guzosie Ike
Arịrịọ a na-arịọ Jehova Chineke ka o chebe ndị ya ma nyere ha aka ịtachi obi n’ọsọ ndụ ha na-agba.
ABỤ 140
Ndụ Onye Ọsụ Ụzọ
Bụọ abụ ga-egosi na ị hụrụ Jehova n’anya, na i nwere ọṅụ n’ọrụ obi ụtọ ị na-arụ nakwa na ị bụ ọsụ ụzọ.
ABỤ 141
Na-achọ Ndị Udo
Abụ a dị ụtọ. Ọ na-ekwu gbasara otú anyị si hụ ndị mmadụ n’anya na otú anyị si agbasi mbọ ike na-achọ atụrụ Chineke.
ABỤ 142
Ikwusara Ụdị Mmadụ Niile Ozi Ọma
Bụọ abụ banyere ịdị mma Jehova na ihe anyị ga-eme iji nabata ụdị mmadụ niile ka ha bụrụ ndị enyi Chineke.
ABỤ 145
Ịkwadebe Maka Ozi Ọma
O nwere ike ịdị anyị ka anyị nọrọ n’ụlọ, ma anyị ga-enwetali ike anyị ga-eji gaa kwusaa ozi ọma.
ABỤ 147
Ndị Pụrụ Iche nke Chineke
Jehova ejighị ụmụ ya o ji mmụọ nsọ tee mmanụ egwuri egwu. Ọ na-agụkwa ha agụụ ime uche ya.
ABỤ 148
I Nyere Anyị Ọkpara Gị
Na-ekele Jehova maka onyinye kachanụ o nyere anyị. O mere ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.
ABỤ 149
Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta
Àjà Jizọs ji obi ya niile chụọ bụ onyinye kachanụ Jehova nyere anyị nke gosiri na ha hụrụ anyị n’anya. Anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova maka ya ruo ebighị ebi.
ABỤ 150
Na-enyekwu Aka n’Ozi Chineke
Bụọ abụ na-egosi na i ji obi ụtọ na-achọ ijere Jehova ozi otú ọ bụla ọ chọrọ.
ABỤ NKE 151
Ikpughe Ụmụ Chineke
Anyị na-atụsi anya ike mgbe Jehova ga-akpọlite ụmụnna Kraịst ka ha gaa eluigwe, soro ya nwee mmeri ma nweta ụgwọ ọrụ.
ABỤ NKE 152
Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị
Nsogbu ụwa mee ka ụjọ jide anyị, Chineke ga-enyeli anyị ike, olileanya, na obi ike.
ABỤ NKE 154
Anyị Ga Na-atachi Obi
Abụ a ga-enyere anyị aka idi nsogbu ma nọgide na-efe Jehova ruo ọgwụgwụ.