Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ 154

Anyị Ga Na-atachi Obi

Anyị Ga Na-atachi Obi

Danloduo ya:

(Matiu 24:13)

  1. Jizọs Kraịst kwuru

    N’ọnwụnwa g’abịara anyị.

    Ọ tar’ahụhụ,

    Man’ọ hụr’ọṅụ dị n’ihu.

    Obi ya dị ná nkwa

    Jehova kwere ya.

    (KORỌS)

    K’anyị gbalịa tachi’obi.

    K’okwukw’anyị si’ike.

    Jaa hụr’anyị dum n’anya.

    Anyị ga n’atachi obi ru’ọgwụgwụ.

  2. O nwer’ik’ịbụ

    N’anyị n’enw’ọtụtụ nsogbu.

    M’anyị n’ahụkwa

    Ndụ ebigh’ebi dị n’ihu.

    Ọ bụ ndụ kacha mma.

    Jisi’ike nweta ya.

    (KORỌS)

    K’anyị gbalịa tachi’obi.

    K’okwukw’anyị si’ike.

    Jaa hụr’anyị dum n’anya.

    Anyị ga n’atachi obi ru’ọgwụgwụ.

  3. A’yị nwer’ob’ike.

    Anyị agaghịkwa ada mbà.

    Ruo n’Amagedọn,

    A’yị ga n’ej’ozi Jehova.

    Oge ahụ dịzi nso.

    K’anyị n’atachi obi.

    (KORỌS)

    K’anyị gbalịa tachi’obi.

    K’okwukw’anyị si’ike.

    Jaa hụr’anyị dum n’anya.

    Anyị ga n’atachi obi ru’ọgwụgwụ.