Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 105

“Chineke Bụ Ịhụnanya”

“Chineke Bụ Ịhụnanya”

(1 Jọn 4:7, 8)

  1. 1. Chineke hụr’anyị n’anya.

    Ọ bụ ya bụị-hụnanya.

    K’anyị hụ Chineke n’anya,

    Hụ ’madụ niile n’anya.

    Ọ g’eme k’anyị dị n’otu.

    Ọ g’eme k’anyị dịn-dụ.

    N’agbalị n’eṅomi Jizọs.

    N’egosi ịhụnanya.

  2. 2. Eziokwu Chineke g’eme

    K’ị mụta ịhụnanya.

    Chineke hụrụ gị n’anya.

    Ọ g’eme k’ị mụta ya.

    Ịhụnanya nwer’obiọma.

    Ọ n’edi ihe niile.

    K’anyị hụ ụmụnna n’anya.

    Jehova g’agọzia-nyị.

  3. 3. Ekwela k’iwe n’ewe gị.

    Ekwela k’o merie gị.

    N’amụta iwu Chineke.

    Iwu ya ga n’edu gị.

    K’anyị hụ Chineke n’anya,

    Hụkwan-dị ’madụ n’anya.

    N’agbalị n’ahụ ha n’anya.

    Chineke bụị-hụnanya.