ABỤ NKE 124
Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya
-
1. K’anyị niile kpebisi’ike
Ịhụ Jehova n’anya.
K’anyị gbalịa mụt’iwu ya.
Anyị nyere yan-dụa-nyị.
Iwu ya k’anyị ga n’eso.
Ọ g’eme k’anyị dịn-dụ.
Jehova bụ ony’eziokwu.
Naanị ya k’anyị g’efe.
-
2. K’anyị niile kpebisi’ike
N’anyị ga n’eṅomi ya.
Anyị nwere eziụ-mụnna.
K’anyị gosi h’obiọma.
N’agbalị n’asọpụrụ ha.
Jehova g’agọzi gị.
K’anyị niile hụ ha n’anya,
N’eso ha n’oge niile.
-
3. K’anyị n’eso ndịo-kenye.
Ọ bụ ha n’eduzia-nyị.
Ha n’enyea-nyị ndụmọdụ.
K’anyị rubere h’isi.
Jehova ga n’agọzia-nyị.
Ọ g’eme k’anyị d’ike.
Anyị niile n’erub’isi,
Jehova ga n’edua-nyị.
(Gụọkwa Ọma 149:1; 1 Tim. 2:8; Hib. 13:17.)