Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 139

Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ

Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ

(Mkpughe 21:1-5)

  1. 1. Hụ onwe gị na mụ onwem

    K’anyị niile nọ n’ụwa ọhụrụ.

    Chee otúo-bi g’adịkwa gị

    Ibi n’udo ma nwer’onwe gị.

    Onye ọjọọ agagh’anọ.

    Ọchịchị Jaa agaghị ada.

    Jizọs malite chịw’anyị n’Al’eze,

    Anyị g’ejia-bụ

    n’ekele Jehova, sị:

    (UKWE)

    “Ezi Chineke, nara ekele.

    Nwa gị mere k’ihe dị ọhụrụ.

    Anyị niile jiọ-ṅụ n’abụa-bụ, n’eto gị.

    Naanị gị nwei-ke n’ebube ru’ebigh’ebi.”

  2. 2. Hụ onwe gị na mụ onwem;

    Lepụa-nya hụ Paradaịs k’ọ n’abịa.

    O nwegh’ebe anyị g’ahụ

    Ihe g’eme k’anyị tụọ ụjọ.

    O mezuola ih’o kwuru.

    Ụlọikwuu ya dịnyeere ’madụ.

    Jehova g’akpọliten-dị nọ n’ili.

    Ha g’ebilite,

    sor’anyị kelee ya, sị:

    (UKWE)

    “Ezi Chineke, nara ekele.

    Nwa gị mere k’ihe dị ọhụrụ.

    Anyị niile jiọ-ṅụ n’abụa-bụ, n’eto gị.

    Naanị gị nwei-ke n’ebube ru’ebigh’ebi.”