ABỤ NKE 23
Jehova Amalitela Ọchịchị Ya
-
1. Jizọs n’achị n’el’igwe.
K’anyị niile n’eto ya.
Ọ nọ n’Ugwu Jehova, na Zayọn.
Bịa k’anyị too Chineke.
Bịa jir’abụ n’eto ya.
Kraịst nọ n’och’eze ya
n’achị n’Al’eze ya.
(UKWE)
Al’eze Jaa g’eweta gịnị?
Ọ g’eweta ezio-mume.
Anyị g’adị ndụe-bigh’ebi.
Ọṅụ g’eju n’ebe niile.
Toonụ Jehova Chineke
N’ihi ịhụnanya ya.
-
2. Jizọs bụe-ze n’el’igwe.
Amagedọn dịkwan-so.
Ọ g’ewepụ Ekwensu nan-dị ya.
Bịa, soro n’ekwusa ya.
Ọtụtụ ka g’anụ ya.
Ugbua kan-dị
’madụ g’abịa fee Jehova.
(UKWE)
Al’eze Jaa g’eweta gịnị?
Ọ g’eweta ezio-mume.
Anyị g’adị ndụe-bigh’ebi.
Ọṅụ g’eju n’ebe niile.
Toonụ Jehova Chineke
N’ihi ịhụnanya ya.
-
3. Eze Jizọs dịe-bube.
Ọchịchị ya kacham-ma.
K’anyị niile sọpụrụ Jizọs Kraịst.
Baa n’ụlọn-sọ Chineke.
Rịọ k’o meere gịe-bere.
Kraịst g’ach’ihe niile
n’oge n’adịgh’anya.
(UKWE)
Al’eze Jaa g’eweta gịnị?
Ọ g’eweta ezio-mume.
Anyị g’adị ndụe-bigh’ebi.
Ọṅụ g’eju n’ebe niile.
Toonụ Jehova Chineke
N’ihi ịhụnanya ya.
(Gụọkwa 2 Sam. 7:22; Dan. 2:44; Mkpu. 7:15.)