Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 28

Ịbụ Enyi Jehova

Ịbụ Enyi Jehova

(Abụ Ọma 15)

  1. 1. Jaa, ònye bụe-nyi gị

    G’ebi n’ụlọikwuu gị?

    Ònye k’ị tụkwasịrị obi?

    Ònye ma gịn-k’ọma?

    Ọ bụo-nye m’Okwu gị,

    Onye n’em’uche gị,

    Ony’ọ bụla n’asọpụrụ gị,

    N’erubere g’isi.

  2. 2. Jaa, ònye bụe-nyi gị

    G’abịa n’och’eze gị?

    Ònye n’eme k’obi gị ṅụrịa?

    Ònye k’ị m’aha ya?

    Ọ bụo-nye n’eto gị,

    N’erubere g’isi,

    Onye kwesịrịn-tụkwasịo-bi,

    Onye n’ekwue-ziokwu.

  3. 3. Anyị n’ekp’ekpere,

    N’akọrọ gịm-kp’anyị,

    K’anyị bụr’enyi, k’ị gọzi’anyị,

    K’ị hụkw’anyị n’anya.

    Anyị g’abụe-nyi gị

    Ruo mgb’ebigh’ebi.

    Ị bụE-nyi kacha enyi niile.

    Ị bụE-nyi pụr’iche.