ABỤ NKE 30
Nna M, Chineke M na Enyi M
-
1. Nsogbu juru n’ụwa.
Ahụhụ juru n’ebe niile.
Ma kw’ụbọchị, m g’asị,
“Ndụm bara uru.”
(UKWE)
Jaa bụ ony’ezio-mume.
Ọ gagh’echefu ozim jere.
Amam n’ọ ga n’eduzim;
Ọ bụ mụ na Jehova nọ.
Ọ ga n’egboro mụm-kpa.
Ọ ga n’echebem ruo n’ọgwụgwụ.
Jehova bụ Nnam n’Enyim
na Chinekem.
-
2. Ogem bụ nwat’agaala.
Ihe niile n’esirim ike.
Ma Jehova g’echebem.
Obi sirim ike.
(UKWE)
Jaa bụ ony’ezio-mume.
Ọ gagh’echefu ozim jere.
Amam n’ọ ga n’eduzim;
Ọ bụ mụ na Jehova nọ.
Ọ ga n’egboro mụm-kpa.
Ọ ga n’echebem ruo n’ọgwụgwụ.
Jehova bụ Nnam n’Enyim
na Chinekem.
(Gụọkwa Ọma 71:17, 18.)