ABỤ NKE 31
Soro Chineke Na-eje Ije
-
1. Soro Chineke n’ej’ije.
Hụ ya n’anya n’obi gị.
Tụkwasị y’obi, nọrọkwa yan-so.
’Mụọn-sọ g’eme k’ị d’ike.
Biko, jir’Okwu ya kpọr’ihe.
Okwu ya g’edu gị.
Kwere ka Jehova duo gị.
N’agbalị n’erub’isi.
-
2. Soro Chineke n’ej’ije.
Debe iwu Chineke.
N’ọnwụnw’ọ bụla, tụkwasị y’obi.
Ọ g’eme k’ị tachi’obi.
Ihe niile kwesịr’otuto,
Ihe niile dịm-ma,
N’eche banyere ha niile.
Chineke ga n’edu gị.
-
3. Soro Chineke n’ej’ije.
Ṅụrị’ọṅụ n’ọ bụE-nyi gị.
N’ekelekwa ya mak’ihe niile
Ọ n’emere gị kemgbe.
Jir’ọṅụ soro ya n’ej’ije.
Jir’abụ n’eto ya.
Ndị ’madụ g’achọpụta
Na Jehova bụ Chi gị.
(Gụọkwa Jen. 5:24; 6:9; Fil. 4:8; 1 Tim. 6:6-8.)