ABỤ NKE 32
Na-akwado Jehova
-
1. Anyị niile n’ekele Jehova.
Ọ kpọpụtar’anyị n’okpukp’ụgha.
O mere k’anyị mụt’eziokwu ya.
Eziokwu ya n’enyen-dụ.
(UKWE)
N’akwado Jehova, hụkwa ya n’anya.
Ọ gagh’ahapụ gị. N’edeb’iwu ya.
Gaa gwa ’madụ niile na udo g’adị.
Ọchịchị Kraịst Jizọs ga n’aga n’ihu.
-
2. Ọ bụ Chineke k’anyị g’akwado,
N’ekwus’Al’eze ya n’ebe niile.
Ony’ọ bụla g’ekpebi n’obi ya
Ịkwado Chinek’anyị.
(UKWE)
N’akwado Jehova, hụkwa ya n’anya.
Ọ gagh’ahapụ gị. N’edeb’iwu ya.
Gaa gwa ’madụ niile na udo g’adị.
Ọchịchị Kraịst Jizọs ga n’aga n’ihu.
-
3. Setan n’agbalị k’anyị tụọ y’ụjọ.
M’anyị tụkwasịrị Chinek’obi.
Ha dịọ-tụtụ, m’anyị dịo-le n’ole.
Jehova g’echeb’anyị.
(UKWE)
N’akwado Jehova, hụkwa ya n’anya.
Ọ gagh’ahapụ gị. N’edeb’iwu ya.
Gaa gwa ’madụ niile na udo g’adị.
Ọchịchị Kraịst Jizọs ga n’aga n’ihu.
(Gụọkwa Ọma 94:14; Ilu 3:5, 6; Hib. 13:5.)