ABỤ NKE 45
Ihe M Na-atụgharị n’Uche
-
1. Nna, biko nyerem aka.
Biko, mee k’ihe dịm n’obi
Bụrụ ihe n’amasị gị,
Kam nọsi’ike n’ọgbakọ gị.
E nwee ihe n’echum ụra,
Ihe n’agbawakwam obi,
Biko, mee kam n’echeta gị,
Mee kam cheta ihe dịm-ma.
-
2. Biko, kam chet’eziokwu gị,
Cheta ihe n’amasị gị,
Ihe niile bụi-he dịm-ma,
K’o mee k’obi n’erum ala.
Nna, echiche gị dịm-ma.
Anyị agagh’amacha ya.
Biko, mee kam tụgharị’uche
N’ihe niile dị n’Okwu gị.
(Gụọkwa Ọma 49:3; 63:6; 139:17, 23; Fil. 4:7, 8; 1 Tim. 4:15.)