ABỤ NKE 52
Ndị Kraịst Nyefere Chineke Onwe Ha
-
1. Ọ bụ Jehova Chineke
K’anyị ga n’ekele.
Jehova ker’ihe niile
N’el’igwe na n’ụwa.
Ọ bụ ya bụ Chi n’enyen-dụ.
O meela k’a mata
Na naanị ya k’e kwesịr’ito.
Naanị ya k’anyị g’efe.
-
2. E mere Jizọs baptizim
K’o mee ucheN-na ya.
O jio-bi ya gwa Jehova
Na ya g’em’uche ya.
Jizọs si na Jọdan pụta.
E tere yam-manụ.
O ruber’isi ruo n’ọgwụgwụ
K’uche Jehova mezuo.
-
3. Nna, biko nar’ekele.
Anyị ga n’eto gị.
Anyị niile jụr’onw’anyị
Ma nyefee gịn-dụa-nyị.
I nyere Nwa gị bụ́ Jizọs
K’ọ bịa gbapụt’anyị.
Ma n’ọnwụ ma nán-dụ, naanị gị
K’anyị ga n’ejer’ozi.
(Gụọkwa Mat. 16:24; Mak 8:34; Luk 9:23.)