ABỤ NKE 67
Kwusaa Okwu Chineke
-
1. Chineke nyer’any’iwu taa.
Ọ gwar’anyị n’ekwusa oziọ-ma.
K’anyị n’ekwusa n’oge niile
Olileanya Chineke nyer’anyị.
(UKWE)
Kwusaanụ ya
Ka ’madụ niile nụ ya.
Kwusaa ya.
Ọgwụgw’ụwa n’erun-so.
Kwusaa ya.
Mee ka ha ghọt’eziokwu.
Kwusaa ya
N’ụwa niile.
-
2. Anyị ma n’a g’akpagbua-nyị.
Ọ n’eme k’ihere mewe ’madụ.
Ha sị k’anyị kwụsị oziọ-ma,
Anyị g’atụkwasị Chinek’obi.
(UKWE)
Kwusaanụ ya
Ka ’madụ niile nụ ya.
Kwusaa ya.
Ọgwụgw’ụwa n’erun-so.
Kwusaa ya.
Mee ka ha ghọt’eziokwu.
Kwusaa ya
N’ụwa niile.
-
3. Eziokwu k’anyị n’ekwusa.
K’anyị jir’oge dịm-ma kwusaa ya.
Anyị n’ekwusa nzọpụta.
Anyị n’edokw’aha Jehovan-sọ.
(UKWE)
Kwusaanụ ya
Ka ’madụ niile nụ ya.
Kwusaa ya.
Ọgwụgw’ụwa n’erun-so.
Kwusaa ya.
Mee ka ha ghọt’eziokwu.
Kwusaa ya
N’ụwa niile.
(Gụọkwa Mat. 10:7; 24:14; Ọrụ 10:42; 1 Pita 3:15.)