ABỤ NKE 82
Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu
-
1. Jizọs Kraịst gwar’anyị
Mee k’ìhè n’enwu,
K’anyị gbalịa kasie
’Madụ niil’obi.
Okw’udo dị n’ime
Okwu Chineke.
N’agbalị n’akụzi ya.
Mee k’ìhè ya nwuo.
-
2. N’ezi ’madụ niile
Ozi Chineke.
Mee ka ha niile nụ
Okwu Chineke.
Ih’anyị n’ekwusa
Si n’AkwụkwọN-sọ.
Ha g’ejia-ka ha kpebie
Ife Chineke.
-
3. K’anyị niile gbalịa
N’eme ebere.
Ọ g’eme k’ozia-nyị
N’eru ha n’obi.
N’eme k’ìhè n’enwu.
N’em’ihe dịm-ma.
Ozia-nyị ga n’atọkwa
Jehova ụtọ.
(Gụọkwa Ọma 119:130; Mat. 5:14, 15, 45; Kọl. 4:6.)