ABỤ NKE 86
Jehova Ga-akụziri Anyị Ihe
-
1. Jir’obiụ-tọ bịa mụọ banyere Jehova.
’Mụọn-sọ n’asị, “Bịa ṅụọ ’mirin-ken-dụ.”
Chineke chọrọ k’anyị mụt’ihe.
Ndị chọr’eziokwu g’amụta ya.
-
2. Jehova chọrọ k’anyị niile mara ya.
Ọ chọghị k’anyị hapụọ-mụmụi-he.
’Mụọn-sọ Chineke, ya n’ụmụnn’anyị,
G’eme k’anyị nọsi’ike n’eziokwu.
-
3. Okw’ụmụnna n’ekwu n’eme k’anyị si’ike.
Abụ ha n’abụ n’erua-nyị n’obi.
K’anyị n’ụmụnna n’anọm-gbe niile.
K’anyị na ha n’ezukọm-gbe niile.
(Gụọkwa Hib. 10:24, 25; Mkpu. 22:17.)