Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 92

Ebe A Kpọkwasịrị Aha Gị

Ebe A Kpọkwasịrị Aha Gị

(1 Ihe E Mere 29:16)

  1. 1. Anyị bịara k’anyị kelee gị.

    Anyị n’eto gị, Jehova.

    Anyị jio-biụ-tọ n’enyefe gị

    Ụlọ ga n’enye gịo-tuto.

    Anyị ma n’ọ bụ gị nyer’anyị

    Ihe niil’anyị ji biri.

    Ihe niile k’anyị n’enye gị.

    Biko, Jehova were ha.

    (UKWE)

    Anyị n’enyefe gị ụlọa.

    K’a mar’aha gị n’ebea.

    Nna, biko nabata ya.

    K’e jiri ya n’eto gị.

  2. 2. Nna, kwe k’anyị nọrọ n’ebea

    N’asọpụrụ gị, n’eto gị.

    K’o mee kan-dị ’madụ mara gị,

    Ka ha sor’anyị n’eto gị.

    Anyị g’anọ na ya n’efe gị.

    Anyị ga n’elekọta ya.

    K’o mee k’ụwa niile mara gị,

    Ka ha sor’anyị n’efe gị.

    (UKWE)

    Anyị n’enyefe gị ụlọa.

    K’a mar’aha gị n’ebea.

    Nna, biko nabata ya.

    K’e jiri ya n’eto gị.