ABỤ NKE 94
Anyị Na-ekele Chineke Maka Okwu Ya
-
1. Anyị n’ekele gị, ezi Chineke.
I mere k’ụmụ ’madụ nweta Baịbụl.
O mere k’anyị h’ụzọ.
O sikwa n’uche gị.
Ọ n’emekwa k’anyị mụt’eziokwu gị.
-
2. Okwu gị n’akp’ike, n’erukwa n’obi.
Ọ n’egos’ihe niile dịa-nyị n’obi.
Iwu gị zukwar’okè.
Ikpe gị zir’ezi.
Ihe dị n’Okwu gị n’eduzikw’anyị.
-
3. Okwu gị, Jehova, n’erua-nyị n’obi.
Ndịa-mụma gị bụ ’madụ dị k’anyị.
BikoN-na, nyer’anyịa-ka
k’anyị nwee okwukwe.
I meela, Jehova, nyea-nyị Okwu gị.
(Gụọkwa Ọma 19:9; 119:16, 162; 2 Tim. 3:16; Jems 5:17; 2 Pita 1:21.)