Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 97

Okwu Chineke Na-enye Ndụ

Okwu Chineke Na-enye Ndụ

(Matiu 4:4)

  1. 1. Okwu Chineke n’enyen-dụ.

    N’agụ ya kw’ụbọchị.

    Ọ n’eme k’obi ru’anyịa-la.

    Anyị g’enwetan-dụ.

    Naanịa-chịcha agagh’eme

    Ka ’madụ dịrịn-dụ.

    (UKWE)

    Okwu Chineke bar’uru,

    N’eme k’anyị dịn-dụ.

    Naanịa-chịcha agagh’eme

    Ka ’madụ dịrịn-dụ.

  2. 2. E nweren-dị n’atụgh’egwu.

    Ha fere Jehova.

    Okwu Chineke gwar’anyị

    Na ha nwer’okwukwe.

    Anyị n’amụ banyere ha,

    Anyị g’enw’okwukwe.

    (UKWE)

    Okwu Chineke bar’uru,

    N’eme k’anyị dịn-dụ.

    Naanịa-chịcha agagh’eme

    Ka ’madụ dịrịn-dụ.

  3. 3. Anyị gụọ Baịbụl kw’ụbọchị,

    Ọ g’akasia-nyịo-bi.

    Ọ g’eme k’anyị tachi’obi

    M’ọnwụnwa bịar’anyị.

    Biko, k’anyị ghar’ichefu

    Ih’anyị mụtara.

    (UKWE)

    Okwu Chineke bar’uru,

    N’eme k’anyị dịn-dụ.

    Naanịa-chịcha agagh’eme

    Ka ’madụ dịrịn-dụ.

(Gụọkwa Jọsh. 1:8; Rom 15:4.)