Ụmụnna ndị a si na telefon a rụnyere n’ihu ụlọ na-ezi onye nọ́ n’ime ụlọ ozi ọma na Viena dị́ n’Ọstria

USORO IHE OMUME OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Ọgọst 2016

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Otú e nwere ike isi nye mmadụ Teta! na Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Jiri aro ndị a dee otú ọzọ ị ga-esi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Nọsie Ike n’Ebe Nzuzo nke Onye Kasị Elu

Olee ebe bụ “ebe nzuzo” Jehova, oleekwa otú ebe ahụ si echebe onye nọ na ya? (Abụ Ọma 91)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Aka Ka Ha Mee Baptizim

Gịnị mere baptizim ji dị oké mkpa? Olee otú ị ga-esi enyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ka o mee baptizim?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Na-eme Nke Ọma n’Isi Awọ́

Ihe ndị e kwuru n’Abụ Ọma nke 92 na-egosi na onye ezi omume merela agadi ka nwere ike ịna-eme nke ọma n’ofufe Chineke.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jehova Na-echeta na Anyị Bụ Ájá

Devid ji ihe atụ dị iche iche kọwaa otú ebere Jehova hà n’Abụ Ọma nke 103.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“Keleenụ Jehova”

Abụ Ọma nke 106 ga-enyere gị aka ịna-egosi Jehova na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị o meere gị.

“Gịnị Ka M Ga-eji Kwụọ Jehova Ụgwọ?”

Olee otú ọbụ abụ a chọrọ isi egosi Jehova na obi dị ya ụtọ maka ihe o meere ya? (Abụ Ọma 116)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-akụzi Eziokwu

Jiri ihe ọhụrụ a na-akụziri ndị mmadụ eziokwu Baịbụl ga-adịrị ha mfe nghọta.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ụlọ Nche Pụrụ Iche Anyị Ga-enye Ndị Mmadụ n’Ọnwa Septemba

Ụlọ Nche ahụ kwuru gbasara nkasi obi, kwuokwa otú Chineke na-esi akasi anyị obi.