Ọgọst 1-7
ABỤ ỌMA 87-91
Abụ nke 49 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Nọsie Ike n’Ebe Nzuzo nke Onye Kasị Elu”: (Nkeji 10)
Ọma 91:1, 2—Jehova na onye ọ bụla nọ “n’ebe nzuzo” ya dị ná mma (w10 2/15 26-27 ¶10-11)
Ọma 91:3—Setan yiri onye na-achụ nta nnụnụ, ọ chọrọ ka anyị ma n’ọnyà ya (w07 10/1 26-30 ¶1-18)
Ọma 91:9-14—Jehova bụ ebe mgbaba anyị (w10 1/15 10 ¶13-14; w01 11/15 19-20 ¶13-19)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Ọma 89:34-37—Olee ọgbụgba ndụ amaokwu ndị a na-ekwu gbasara ya, oleekwa ihe Jehova ji tụnyere otú ọ ga-esi emezu ya? (w14 10/15 10 ¶14; w07 7/15 32 ¶3-4)
Ọma 90:10, 12—Olee “otú anyị ga-esi na-agụ ụbọchị anyị ka anyị wee nweta obi amamihe”? (w06 7/15 13 ¶4; w01 11/15 13 ¶19)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ọma 90:1-17
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Kwadebe Otú Anyị Ga-esi Zie Ozi Ọma n’Ọnwa A: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ndị na-egosi otú anyị ga-esi ezi ndị mmadụ ozi ọma. E kirichaa nke ọ bụla, a tụlee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na ya. Gbaa ụmụnna ume ka ha dee otú ọzọ ha nwere ike isi zie mmadụ ozi ọma.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Mkpa ọgbakọ: (Nkeji 5)
“Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Aka Ka Ha Mee Baptizim”: (Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-agba otu nwanna ajụjụ ọnụ. Ọ ga-abụ onye nyeerela mmadụ aka ya emee baptizim. Mgbe ọ na-amụrụ onye ahụ ihe, olee otú o si nyere ya aka ka o jiri obi ya niile hụ Jehova n’anya? Olee otú o si nyere ya aka ka ọ malite ime ihe ndị mere ka o ruo eru ime baptizim?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) ia isi nke 21 ¶1-12
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 137 na Ekpere