Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 87-91

Nọsie Ike n’Ebe Nzuzo nke Onye Kasị Elu

Nọsie Ike n’Ebe Nzuzo nke Onye Kasị Elu

Jehova na onye ọ bụla nọ “n’ebe nzuzo” ya dị ná mma

91:1, 2, 9-14

  • Ọ bụ mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị ma mee baptizim ka anyị ga-abanye n’ebe nzuzo ya

  • Ndị na-anaghị efe Chineke amaghị gbasara ebe nzuzo a

  • O nweghị onye ma ọ bụ ihe ga-eme ka onye nọ́ n’ebe nzuzo Jehova kwụsị inwe okwukwe na ya ma ọ bụkwanụ kwụsị ịhụ ya n’anya

“Onye na-achụ nta nnụnụ” na-achọ ka anyị ma n’ọnyà ya

91:3

  • Nnụnụ dị akọ, ịnwụde ya adịghịkwa mfe

  • Onye na-achụ nta nnụnụ na-ebu ụzọ amata ihe na-amasị nnụnụ ọ chọrọ ịnwụde, ya ejirizie ihe ahụ siere ya ọnyà

  • Setan yiri onye na-achụ nta nnụnụ. Ọ mata otú anyị si akpa àgwà, ya esiere anyị ọnyà nwere ike ime ka anyị nupụrụ Chineke isi

Ụfọdụ n’ime ọnyà ndị jogburu onwe ha Setan na-esiri anyị bụ:

  • Ịtụ Mmadụ Egwu

  • Ịchụ Akụnụba

  • Ntụrụndụ Na-adịghị Mma

  • Esemokwu