Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Aka Ka Ha Mee Baptizim

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Aka Ka Ha Mee Baptizim

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ihe ga-eme ka ndị anyị na-amụrụ ihe na Jehova dị ná mma bụ ha inyefe ya onwe ha ma mee baptizim. (1 Pita 3:21) O nweghị ihe ọ bụla ga-emebi adịm ná mma ahụ ma ọ bụrụ na ha na-erubere Chineke isi. (Ọma 91:1, 2) Ọ bụ Jehova ka Onye Kraịst na-enyefe onwe ya. N’ihi ya, onye anyị na-amụrụ Baịbụl kwesịrị imewe ihe ndị ga-eme ka ọ hụkwuo Jehova n’anya ma chọwa igosi ya na obi dị ya ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere ya.—Rom 14:7, 8.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Unu mụwa ihe, mee ka ọ ghọta ihe ihe ahụ unu na-amụ na-ekwu gbasara Jehova. Na-agba ya ume ka ọ na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị ma na-ekpechi ekpere anya.—1 Tesa. 5:17; Jems 4:8

  • Gwa ya ka ọ gbaa mbọ nyefee Chineke onwe ya ma mee baptizim. Nyekwara ya aka ka ọ na-eme ihe ndị ga-eme ka o ruo eru ime ha. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, ịna-akọrọ ndị agbata obi ya na ndị ya na ha na-arụ ọrụ ihe ọ na-amụta. Chetakwa na Jehova anaghị amanye onye ọ bụla ifewe ya. Ọ bụ mmadụ ga-eji aka ya ekpebi na ya ga-enyefe Chineke onwe ya.—Diut. 30:19, 20

  • Gbaa ya ume ka ọ gbaa mbọ gbanwee àgwà ndị o kwesịrị ịgbanwe ka o nwee ike iru eru ime baptizim. (Ilu 27:11) O nwere ike ịbụ na o nwere àgwà ọjọọ ụfọdụ ririla ya ahụ́. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-enyere ya aka ka ọ kwụsị àgwà ọjọọ ndị ahụ ma malite ịkpa àgwà ọma. (Efe. 4:22-24) Gwa ya gbasara ndị ụfọdụ a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ.” Isiokwu a na-agbakarị n’Ụlọ Nche

  • Kọọrọ ya ihe ndị merela gị obi ụtọ n’ozi Jehova.—Aịza. 48:17, 18