Ọgọst 15-21
ABỤ ỌMA 102-105
Abụ nke 80 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Jehova Na-echeta na Anyị Bụ Ájá”: (Nkeji 10)
Ọma 103:8-12—Jehova na-emere anyị ebere, na-agbaghara anyị mmehie ma anyị chegharịa (w13 6/15 20 ¶14; w12 7/15 16 ¶17)
Ọma 103:13, 14—Jehova ma otú ike anyị hà (w15 4/15 26 ¶8; w13 6/15 15 ¶16)
Ọma 103:19, 22—Ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka ebere Jehova na-emere anyị, anyị ga na-erubere ya isi (w10 11/15 24-25 ¶5; w07 12/1 21 ¶1)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Ọma 102:12, 27—Olee otú icheta na anyị na Jehova dị ná mma ga-esi abara anyị uru mgbe anyị dara mbà? (w14 3/15 16 ¶19-21)
Ọma 103:13—Gịnị mere na ọ bụghị mgbe niile ka Jehova na-aza ekpere anyị ozugbo? (w15 4/15 25 ¶7)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ọma 105:24-45
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) g16.4 10-11. Gwa onye ahụ ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) g16.4 10-11. Gwakwa ya ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) bhs isi nke 17 ¶3-4. Nyere onye ahụ aka ka ọ ghọta otú ọ ga-esi eme ihe e kwuru ebe ahụ.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Echefukwala Ihe Niile Jehova Meere Gị (Ọma 103:1-5): (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Buru ụzọ kpọnye vidio bụ́ Ndụ M Na-ebi Gwụrụ M Ike. (Gaa na jw.org/ig, pịa GBASARA ANYỊ, pịa IHE NDỊ ANYỊ NA-EME.) Tụlezienụ ajụjụ ndị a: Gịnị na gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eto Jehova? Olee ihe ọma ị na-atụ anya na Jehova ga-emere anyị n’ọdịnihu?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) ia isi nke 22 ¶1-13
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 131 na Ekpere