Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 102-105

Jehova Na-echeta na Anyị Bụ Ájá

Jehova Na-echeta na Anyị Bụ Ájá

Devid ji ihe atụ dị iche iche kọwaa otú ebere Jehova hà.

  • 103:11

    Otú ahụ anyị na-agaghị aghọtachali otú eluigwe si dị anya n’ụwa, ka anyị na-agaghị aghọtachali otú obiọma Jehova hà

  • 103:12

    Jehova na-eme ka mmehie anyị dị ezigbo anya n’ebe anyị nọ, otú ahụ ọwụwa anyanwụ si dị anya n’ọdịda anyanwụ

  • 103:13

    Jehova na-emere ndị mmehie chegharịrị echegharị ebere, otú ahụ nna na-esi emetere nwa ya ihe na-egbu mgbu ebere