Ọgọst 22-28
ABỤ ỌMA 106-109
Abụ nke 2 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Keleenụ Jehova”: (Nkeji 10)
Ọma 106:1-3—Anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova (w15 1/15 8 ¶1; w02 6/1 17-18 ¶19)
Ọma 106:7-14, 19-25, 35-39—Ụmụ Izrel chefuru ihe ọma niile Jehova meere ha, malitezie inupụrụ ya isi (w15 1/15 8-9 ¶2-3; w01 6/15 13 ¶1-3)
Ọma 106:4, 5, 48—E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ịna-ekele Jehova (w11 10/15 5-6 ¶7; w03 12/1 15-16 ¶3-6)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Ọma 109:8—Chineke ọ̀ dị mbụ kpebie na ọ bụ Judas ga-emezu amụma e buru gbasara ịrara Jizọs nye? (w00 12/15 24 ¶20; it-1-E 857-858)
Ọma 109:31—Olee otú Jehova si ‘eguzo n’aka nri ogbenye’? (w06 9/1 14 ¶8)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ọma 106:1-22
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) ll 6. Gwa onye ahụ ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) ll 7. Gwakwa ya ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) bhs isi nke 18 ¶14-16. Nyere onye ahụ aka ka ọ ghọta otú ọ ga-esi eme ihe e kwuru ebe ahụ.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jehova Ga-egboro Anyị Mkpa Anyị (Ọma 107:9): (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Buru ụzọ kpọnye vidio bụ́ Jehova Ga-egboro Anyị Mkpa Anyị. (Gaa na Tiivi anyị dị́ na jw.org, pịa HỌRỌ VIDIO Ị CHỌRỌ, pịa EZINỤLỌ.) Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) ia isi nke 22 ¶14-24, na igbe dị na peeji nke 194
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 149 na Ekpere